Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI KỌRINT 2:1-11

II. NDI KỌRINT 2:1-11 Bible Nso (IGBOB)

Ma ezuputaram onwem nka, na m'gaghi-abiakute unu ọzọ n'ihe-nwuta. N'ihi na asi na mu onwem eme ka o wuta unu, ònye bu kwa onye gēme ka obi tọm utọ, ma-ọbughi onye ahu nke anēme ka o wuta ya site na mu onwem? Ede-kwa-ram otù ihe nka n'akwukwọ, ka m'we ghara inwe ihe-nwuta mb͕e m'biara n'aka ndi o kwesiri ka m'ṅuria ọṅu n'aru ha; ebe m'tukwasiworo obi n'ebe unu nile nọ, na ọṅùm bu ọṅù nke unu nile. N'ihi na m'sitere na nkpab͕u na ihe-nb͕u nke obi riri nne were ọtutu anya-miri degara unu akwukwọ; ọ bughi ka eme ka o wuta unu, kama ka unu we mara ihu-n'anya nke m'hubigara unu ókè kari. Ma ọ buru na onye ọ bula emewo ka o wuta ayi, ọ bughi mu onwem, kama, n'otù akuku (ka m'ghara idọb͕u unu nke-uku) ọ bu unu nile ka o meworo ka o wuta. O zuworo madu di otú a, bú nba nka nke ndi ka n'ọnu-ọgugu nime unu bara ya; ya mere, kama ibara ya nba ọzọ anamachọ ka unu were amara b͕aghara ya kasi kwa ya obi, ka aghara iji ihe-nwuta nke nēwutabiga ya ókè loda madu di otú a n'uzọ ọ bula. N'ihi nka ariọm unu ka unu me ka ihu-n'anya unu huru ya buru ihe di itukwasi obi. N'ihi na ihe mere m'degara unu akwukwọ bu kwa nka, ka m'we mara nnwaputa unu, ma unu bu ndi nāṅa nti rue ihe nile. Ma onye ọ bula unu were amara b͕aghara ya ihe ọ bula, mu onwem were kwa amara b͕aghara ya: n'ihi na ihe mu onwem werewo-kwa-ra amara b͕aghara, ma ọ buru na ewerewom amara b͕aghara ihe ọ bula, ọ bu n'ihi unu ka m'meworo ya n'iru Kraist; ka Setan we ghara irib͕u ayi: n'ihi na ayi abughi ndi nāmaghi ihe nile ọ nēchèputa.

II. NDI KỌRINT 2:1-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ekpebiri m nʼime obi m na-agaghị m abịakwute unu ọzọ, iwetara unu ihe mwute. Nʼihi na ọ bụrụ na m eme ka obi jọọ unu njọ, onye kwanụ ga-akasị m obi ma ọ bụghị unu, unu onwe unu ndị m mere ka obi jọọ njọ? E deere unu akwụkwọ a dịka m kwesiri ime ka m ghara inwe mwute mgbe m bịara, site nʼaka ndị kwesiri ime ka obi dị m mma, nʼihi na o doro m anya na ọṅụ m ga-abụ ọṅụ nke unu niile. Eji m anya mmiri dị ukwuu na oke obi mgbu na obi mgbawa deere unu akwụkwọ, ọ bụghị ka m kpasuo unu iwe kama ka unu nwee ike ịmata oke ịhụnanya m nwere nʼebe unu nọ. Ọ bụrụ na onye ọbụla mere ihe butere obi mgbu, ka a hapụ ikwu ya karịa ka o kwesiri, ọ bụghị naanị m ka o wetaara obi mgbu, o wetakwaara unu niile obi mgbu. Nʼihi na ntaramahụhụ unu niile kpebiri nye ya ezuola. Ugbu a, bikonu ụmụnna m, o kwesiri ka unu gbaghara ya, ma kasịe ya obi, ka ọ hapụ inwe obi ilu maọbụ daa mba na mmụọ ya, rubiga ụjụ oke. Ya mere ana m arịọ unu, bikonu, gosinụ ya na unu hụrụ ya nnọọ nʼanya. Ihe mere m ji dee ihe m dere nʼakwụkwọ nke mbụ bụ ka m chọpụta ma unu jikekwara mgbe niile irube isi nʼihe niile. Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ahụ mụ onwe m kwa agbagharala ya. Mgbaghara m, a sịkwa na o nwere ihe m na-agbaghara, ana m eme ya nʼihi unu nʼihu Kraịst. Anyị na-eme nke a ka Ekwensu ghara ịghọgbu anyị. Anyị maara ihe niile ọ na-ezube.