II. NDI KỌRINT 11:30-33
II. NDI KỌRINT 11:30-33 Bible Nso (IGBOB)
Ọ buru na aghaghi m inya isi, m'gānya isi n'ihe nke diri adighi-ikem. Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus, Onye bu onye agọziri agọzi rue mb͕e nile ebighi-ebi, Ọ matara na ekwughi m okwu-ugha. Nime Damaskọs onye-isi ala nke nọ n'okpuru Aretas, bú eze, nēche obodo ndi Damaskọs nche, ijidem: site kwa na window ka esi na mb͕idi radam n'ihe akpara akpa, m'we b͕apu n'aka-ya.
II. NDI KỌRINT 11:30-33 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Kama ọ bụrụ na o kwesiri ka m nyaa isi aga m anya isi banyere ihe ndị ahụ na-egosi adịghị ike m. Chineke, na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs, onye e kwesiri ito aha ya ruo mgbe ebighị ebi, maara na ihe ndị a niile m na-ekwu bụ eziokwu. Nʼobodo Damaskọs, onye ọchịchị ala ahụ nke eze obodo ahụ a na-akpọ Aretas họpụtara, ndị na-eche obodo Damaskọs nche ka ha jide m. Ma e tinyere m nʼime nkata, site nʼoghere dị na mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu wedata m, m gbanarị ya.