II. IHE EMERE 9:29-31
II. IHE EMERE 9:29-31 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma banyere Ihe ndị ọzọ mere nʼoge ọchịchị Solomọn, site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ Netan onye amụma, nʼime akwụkwọ amụma Ahija, onye Shilo, nakwa nʼọhụ Ido onye ọhụ ụzọ, banyere Jeroboam nwa Nebat? Solomọn chịrị Izrel niile iri afọ anọ na Jerusalem. O sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ. E lie ya nʼobodo Devid bụ nna ya. Rehoboam nwa ya ghọkwara eze nʼọnọdụ ya.
II. IHE EMERE 9:29-31 Bible Nso (IGBOB)
Ma ihe nile Solomon mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, èdeghi ihe ndia n'akwukwọ ihe emere nke Netan, bú onye-amuma, na n'obubu-amuma nke Ahaija, bú onye Shailo, na n'ọhù nile nke Ido, bú onye-ọhu-uzọ, bayere Jeroboam nwa Nebat? Solomon we buru eze Israel nile nime Jerusalem ọgu arọ abua. Solomon we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid, bú nna-ya: Rehoboam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.