II. IHE EMERE 8:11-18
II. IHE EMERE 8:11-18 Bible Nso (IGBOB)
Solomon we me ka nwa-nwayi Fero si n'obodo Devid rigorue ulo ahu nke o wuru nye ya: n'ihi na ọ siri, Nwunye m'nwere agaghi-ebi n'ulo Devid, bú eze Israel, n'ihi na ebe nile di nsọ, bú nke ib͕e Jehova bataworo nime ha. Mb͕e ahu Solomon surere àjà-nsure-ọku nye Jehova n'elu ebe-ichu-àjà Jehova, nke O wuru n'iru uzọ-nbata, ọbuná dika ihe ubọchi si di n'ubọchi-ya, n'isure àjà-nsure-ọku dika ihe Moses nyere n'iwu si di, n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na na mb͕e nile akara àkà, ub͕ò atọ n'arọ, bú n'ememe achicha ekoghi-eko, na n'ememe nke izù asa nke ubọchi asa, na n'ememe ulo-ntu. Dika ikpé Devid, bú nna-ya, si di, o we guzo òkè nile nke ndi-nchu-àjà bayere òfùfè-ha, na ndi Livai bayere ihe-ndebe nile ha, ito Chineke, na ije ozi n'iru ndi-nchu-àjà, ime ihe ubọchi n'ubọchi-ya: o guzo-kwa-ra ndi-ọnu-uzọ-ama n'òkè nile ha n'ọnu-uzọ-ama ọ bula: n'ihi na otú a ka ihe si di nke Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu. Ma ha ewezugaghi onwe-ha n'ihe eze nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai n'iwu bayere ihe ọ bula, baye-kwa-ra àkù nile. Ewe dozie ije-ozi nile nke Solomon rue ubọchi atọrọ ntọ-ala ulo Jehova, ru kwa mb͕e ewubìri ya. Ewuzuru ulo Jehova. Mb͕e ahu Solomon jeruru Ezion-geba, ru kwa Ilot, n'usọ oké osimiri, n'ala Edom. Huram we zitere ya ub͕ọ na ndi-orù ndi mara oké osimiri n'aka ndi-orù-ya; ha na ndi-orù Solomon we biarue Ofia, si n'ebe ahu weta nnù talent ọla-edo na ọgu abua na iri, wetara eze, bú Solomon.
II. IHE EMERE 8:11-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Solomọn kpọpụtara ada Fero site nʼobodo Devid, gaa nʼụlọeze nke o wuuru ya, nʼihi na ọ sịrị, “Nwunye m agaghị ebi nʼụlọeze Devid, bụ eze Izrel, nʼihi na ebe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị banyere abụrụla ebe dị nsọ.” Emesịa, Solomọn chụrụ aja nsure ọkụ nye ONYENWE ANYị, nʼelu ebe ịchụ aja ONYENWE ANYị, nke o wuru nʼihu mpụta ọnụ ụlọ ụlọnsọ ukwu ahụ, ọbụladị dịka iwu metụtara aja e kwesiri ịchụ kwa ụbọchị si dị, bụ nke Mosis nyere nʼiwu. Aja ndị a bụ maka Ụbọchị Izuike, Ọnwa Ọhụrụ na ụdị mmemme atọ a na-eme nʼafọ, ndị bụ mmemme achịcha ekoghị eko, mmemme izu ụka asaa na mmemme ụlọ Ikwu. O sitere nʼusoro ije ozi nke Devid, họpụtara otu ndị nchụaja ọrụ dị iche iche ha na-arụ ụbọchị niile. O nyekwara ndị Livayị ọrụ idu nʼotuto a na-enye Chineke na inyere ndị nchụaja aka ime ihe ụbọchị ọbụla nʼụbọchị ya. Kenyekwa ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ niile nche oke ọrụ ha nʼotu nʼotu, nʼihi na nke a bụ ihe Devid, onye nke Chineke nyere nʼiwu. Ha ewezugaghị onwe ha nʼiso iwu niile eze nyere ndị nchụaja maọbụ ndị Livayị banyere ihe ọbụla na ihe gbasakwara ụlọakụ niile. A rụzuru ọrụ niile Solomọn zubere ịrụ, site nʼụbọchị a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị tutu ruo mgbe ewuchara ya. Ya mere, e wuchara ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị. Mgbe ahụ, Solomọn gara Eziọn Geba na Elat nke dị nʼọnụ osimiri, nʼala Edọm. Hiram zigaara ya ọtụtụ ụgbọ mmiri nke ndị ikom ya na-anya ụgbọ mmiri na-edu, bụ ndị maara ihe banyere ime njem nʼosimiri nke ọma. Ndị a, ha na ndị ikom Solomọn nyaara ụgbọ gaa Ọfịa site nʼebe ahụ bulatara eze Solomọn, ọlaedo ịdị arọ ya ruru puku kilogram iri na ise na narị atọ.