II. IHE EMERE 7:1-3
II. IHE EMERE 7:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ngwangwa, mgbe Solomọn kpesịrị ekpere a, ọkụ sitere nʼeluigwe daa repịa aja nsure ọkụ ahụ na aja ahụ niile. Ebube ONYENWE ANYị jupụtakwara nʼụlọnsọ ukwu ahụ, Ndị nchụaja enweghị ike ịbanye nʼime ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị nʼihi ebube ONYENWE ANYị nke jupụtara ụlọnsọ ahụ. Mgbe ọha ndị Izrel niile hụrụ ọkụ ahụ si nʼelu daa, hụkwa ebube ONYENWE ANYị ka o guzo nʼelu ụlọnsọ ukwu ahụ, ha dara nʼala kpọọ isiala nye ONYENWE ANYị, kelee ya ekele sị: “Nʼihi na Ọ dị mma ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
II. IHE EMERE 7:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e Solomon kpebìri ekpere, ọku siri n'elu-igwe ridata, we ripia àjà-nsure-ọku na àjà nile; ebube Jehova we juputa ulo ahu. Ndi-nchu-àjà apughi kwa ibà n'ulo Jehova, n'ihi na ebube Jehova juputara ulo Jehova. Umu Israel nile nēlekwasi kwa nrida ọku ahu anya, ya na ebube Jehova nke di n'elu ulo ahu; ha we ruru ala, kpuchie iru-ha n'ala n'elu pavement, kpọ isi ala, we kele Jehova, si, N'ihi na Ọ di nma; n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.