II. IHE EMERE 36:22-23
II. IHE EMERE 36:22-23 Bible Nso (IGBOB)
Ma n'arọ mbu nke Sairọs, bú eze Peasia, ka okwu Jehova nke sitere n'ọnu Jeremaia we rè, Jehova kpọtere mọ nke Sairọs, bú eze Peasia, o we kwusa n'ala-eze-ya nile, ọzọ kwa, o tiyere ya n'odide-akwukwọ, si, Otú a ka Sairọs, bú eze Peasia, siri, Ala-eze nile nke uwa ka Jehova, bú Chineke elu-igwe, nyeworom; Ya onwe-ya me-kwa-ram ka m'buru onye-nlekọta n'iwuru Ya ulo nime Jerusalem, nke di na Juda. Ònye nọ n'etiti unu site na ndi-Ya nile? ka Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya, ya rigo kwa.
II. IHE EMERE 36:22-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs eze Peshịa, ime ka okwu ONYENWE ANYị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, ONYENWE ANYị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị, “Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru: “ ‘ONYENWE ANYị, Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa. O nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda. Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga, ka ONYENWE ANYị Chineke ha nọnyekwara ha.’ ”