II. IHE EMERE 33:14-25
II. IHE EMERE 33:14-25 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ihe ndia gasiri, o wuere obodo Devid mb͕idi n'azu mb͕idi-ya, n'akuku Ọdida-anyanwu nke Gaihon, nime ndagwurugwu, we rue nbata n'ọnu-uzọ-ama azù; ọ b͕a kwa Ofel buruburu, me ka ọ di elu nke-uku: o do-kwa-ra ndi-isi usu-ndi-agha n'obodo nile ewusiri ike nime Juda. O wezuga-kwa-ra chi nile nke ala ọzọ, si kwa n'ulo Jehova wezuga oyiyi-ihe ahu, ya na ebe-ichu-àjà nile nke o wuru n'ugwu ulo Jehova, na nime Jerusalem, o kpofue ha n'azu obodo. O wue ebe-ichu-àjà Jehova, chua n'elu ya àjà, bú àjà-udo na àjà-ekele, ọ si Juda ka ha fè Jehova, bú Chineke Israel, òfùfè. Otú ọ di, ndi Juda nọ nāchu àjà n'ebe di elu nile, ma ọ bu nání nye Jehova, bú Chineke-ha. Ma ihe nile Manase mere nke fọduru, na ekpere-ya o kpere Chineke-ya, na okwu nile nke ndi-ọhu-uzọ, bú ndi gwara ya okwu n'aha Jehova, bú Chineke Israel, le, edewo ha n'akwukwọ ihe ndi-eze Israel mere. Ekpere-ya kwa, na otú ekwere ka ọ riọta ìhe, na nmehie-ya nile, na nmekpu-ya, na ebe nile nke o wuru ebe di elu nime ha, guzo kwa Asherim na arusi apiri api, tutu o ruru ala: le, edewo ha n'akwukwọ okwu Hozai. Manase we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya, n'ulo-ya: Emon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. Emon b͕ara orú arọ na abua mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ abua nime Jerusalem. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika Manase, bú nna-ya, mere: Emon we chuara arusi nile apiri api, bú nke Manase nna-ya mere, àjà, we fè ha òfùfè. Ma o rurughi ala n'iru Jehova, dika Manase, bú nna-ya, ruru ala; kama Emon nka mere ka ikpe ma ya ri nne. Ndi-orù-ya we kekọta onwe-ha imegide ya, ha we me ka ọ nwua n'ulo-ya. Ndi ala ahu we tib͕ue ndi nile nēkekọta onwe-ha imegide eze, bú Emon: ndi ala ahu we me Josaia nwa-ya eze n'ọnọdu ya.
II. IHE EMERE 33:14-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ nʼoge a ka o wughachiri mgbidi nke abụọ gburugburu obodo Devid, na mgbidi dị nʼọdịda anyanwụ iyi Gaihọn na ndagwurugwu Kidrọn. Site nʼebe ahụ, o wuru ya ruo nʼọnụ ụzọ ama Azụ, na gburugburu ugwu Ofel ebe o wuliri ya elu. O dokwara ndịisi agha ya nʼobodo niile e wusiri ike dị na Juda. O wezugara chi ndị mba ọzọ niile, wepụkwa oyiyi ahụ o tinyere nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị, kụtuokwa ụlọ arụsị o wuru nʼugwu ụlọnsọ, na ndị nke o wuru na Jerusalem. O sitere nʼobodo bufuo ha. Emesịa, o wugharịrị ebe ịchụ aja ONYENWE ANYị dị nʼụlọnsọ ukwu Chineke, chụọ aja udo na aja ekele nʼelu ya. O nyekwara ndị Juda niile iwu sị ha fee ONYENWE ANYị Chineke nke Izrel ofufe. Ma ụfọdụ ndị Juda nọgidekwara na-achụ aja nʼugwu, maọbụ naanị ONYENWE ANYị Chineke ha ka ha na-achụrụ aja ndị a. Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Manase na ekpere nke o kpeere Chineke ya, na okwu niile ndị ọhụ gwara ya nʼaha ONYENWE ANYị, bụ Chineke nke Izrel, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Izrel niile. Ekpere ya, na ọsịsa Chineke zara ya, na mmehie ya niile, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya, na ebe niile o wuru ụlọ arụsị nʼelu ugwu, na ebe ọ manyere ogidi arụsị Ashera, na arụsị ndị ọzọ, tupu o weda onwe ya ala, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị amụma. Manase sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼụlọeze ya. Amọn, ọkpara ya, nọchiri ya. Amọn gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ abụọ na Jerusalem. O mere ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYị dịka nna ya Manase mere. Amọn kpọrọ isiala, chụọkwa aja nye arụsị niile, nke Manase mere. Ma o wedaghị onwe ya ala nʼihu ONYENWE ANYị dịka Manase nna ya mere. Kama Amọn gara nʼihu mee ka ikpe ọmụma ya mụbaa. Ndị na-ejere Amọn ozi gbara izu megide ya, ha gburu ya nʼime ụlọeze ya. Mgbe ahụ, ndị ala ahụ gburu ndị niile ahụ gbara izu megide eze Amọn. Ha mere Josaya nwa ya nwoke eze nʼọnọdụ ya.