II. IHE EMERE 3:15-17
II. IHE EMERE 3:15-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O wuru ogidi abụọ dị nʼihu ụlọnsọ ahụ, nke ịdị elu ya ruru mita iri na asaa. Ọ kpụkwara ihe a dokwasịrị nʼelu ogidi ndị a, nke ịdị elu ha dị mita abụọ na ọkara. Ọ kpụkwara ihe yiri ụdọ igwe a tụrụ atụ, nke e kokwasịrị nʼelu ogidi abụọ ndị ahụ. Kpụọkwa narị mkpụrụ pomegranet, nke a ganyekọtara ya na ụdọ igwe ahụ. O guzobere ogidi abụọ ndị ahụ nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ, otu nʼakụkụ ugwu nke ọzọ nʼakụkụ ndịda. Ogidi nke dị na ndịda ka ọ kpọrọ Jakin, ma nke dị nʼugwu ka ọ kpọrọ Boaz.
II. IHE EMERE 3:15-17 Bible Nso (IGBOB)
O me kwa n'iru ulo ogidi abua, orú cubit na iri na ise ka ogologo-ha di, isi nke di n'elu-ha n'otù n'otù di kwa cubit ise. O me kwa iyab͕a n'ime-ime-ulo ahu, tiye ha n'elu ogidi ahu; o me-kwa-ra ọgu pomegranate ise, tiye ha n'elu iyab͕a. O guzo ogidi abua ahu n'iru ulo uku Chineke, otù n'aka-nri, otù n'aka-ekpe; o we kpọ aha ogidi aka-nri Jakin, na aha ogidi aka-ekpe Boaz.