Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. IHE EMERE 29:3-36

II. IHE EMERE 29:3-36 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼọnwa mbụ nke afọ ahụ e mere ya eze ka o meghere ụlọnsọ ONYENWE ANYị, mezie ime ya. Ọ kpọrọ ndị Livayị, na ndị nchụaja niile oku nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ukwu Chineke, gwa ha okwu sị ha, “Geenụ m ntị unu ndị Livayị, doonụ onwe unu nsọ, dokwaanụ ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị Chineke nna nna unu nsọ. Wezuganụ ihe arụ niile dị nʼebe nsọ nke ụlọnsọ ahụ. Nʼihi na nna anyị ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi; ha mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYị bụ Chineke anyị, hapụ ya. Ha wepụrụ ihu ha site nʼebe obibi ONYENWE ANYị, gbakụtakwa ya azụ. Ha mechikwara ụzọ ndị e si abanye na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, menyụọkwa ọkụ dị nʼime ya. E sureekwaghị ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ọ dịkwaghị aja nsure ọkụ ọbụla a chụrụ nye Chineke nke Izrel. Nʼihi nke a ka iwe ONYENWE ANYị ji dakwasị Juda na Jerusalem. O meela ka ha buru ihe oke egwu, na oke ihere na oke ụjọ, dịka unu jirila anya unu hụ. E gburu nna anyị ha nʼagha, dọtakwa ndị nwunye anyị na ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa anyị nʼagha nʼihi ya. Ma ugbu a, achọrọ m ka anyị na ONYENWE ANYị Chineke nke Izrel gbaa ndụ, ka iwe ya jụrụ nʼebe anyị nọ. Ụmụ m, o kwesighị ka unu gbakụta ọrụ unu azụ ọzọ, nʼihi na ONYENWE ANYị họpụtara unu iguzo nʼihu ya, na ijere ya ozi, na ịrụ ọrụ nʼihu ya, na ịchụrụ ya aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.” Nʼoge a ndị Livayị ndị a malitere ọrụ: site nʼikwu Kohat: Mahat na Amasai, na Juel nwa Azaraya; nʼikwu Merari: Kish nwa Abdi, na Azaraya nwa Jehalelel; nʼikwu Geshọn: Joa nwa Zima, na Eden nwa Joa; nʼikwu Elizafan: Shimri, na Jeiel; nʼikwu Asaf: Zekaraya, na Matanaya; nʼikwu Heman: Jehiel, na Shimei; nʼikwu Jedutun: Shemaya, na Uziel. Mgbe ha kpọkọtara ụmụnna ha bụ ndị Livayị, dokwaa onwe ha ọcha, ha bara ido ụlọnsọ ONYENWE ANYị nsọ, dịka eze nyere nʼiwu, nʼusoro okwu ONYENWE ANYị si dị. Ndị nchụaja banyere nʼime ebe nsọ ahụ ido ya nsọ. Ihe niile na-adịghị ọcha ha hụrụ nʼime ya ka ha wepụtasịrị nʼogige ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị ahụ. Ndị Livayị buuru ha gaa bufuo na Ndagwurugwu Kidrọn. Ha bidoro mmemme ido nsọ a nʼabalị mbụ nʼọnwa nke mbụ. Nʼabalị nke asatọ ha ruru na mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ ONYENWE ANYị. Ma o were ha abalị asatọ ọzọ idochasị ụlọnsọ ahụ nsọ maka ofufe, ha jezuru ozi niile nʼabalị iri na isii nke ọnwa mbụ ahụ. Mgbe ahụ, ha bakwuru eze bụ Hezekaya kọọrọ ya sị, “Anyị emeela ebe niile nʼụlọnsọ ONYENWE ANYị ka ọ dị nsọ, ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na ngwongwo ya, na tebul ịdọba achịcha e doro nsọ, na ihe niile dị nʼime ya. Ọzọ, anyị edoziela ma dokwaa ngwongwo ahụ niile nsọ, bụ nke eze Ehaz wepụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya mgbe ọ bụ eze. Ha dịkwa ugbu a nʼihu ebe ịchụ aja nke ONYENWE ANYị.” Nʼụtụtụ echi ya, eze bụ Hezekaya kpọkọtara ndịisi obodo niile, gaa nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị ahụ. Ha wetara oke ehi asaa, na ebule asaa, na ụmụ ebule asaa, na mkpi asaa, maka ịchụ aja mmehie nʼihi alaeze ahụ, maka ụlọnsọ ukwu ahụ, na ala Juda. Eze nyere ndị nchụaja bụ ụmụ Erọn iwu sị ha gbuo anụ ụlọ ndị ahụ nʼebe ịchụ aja nye ONYENWE ANYị. Ya mere, ha gburu oke ehi ahụ niile. Ndị nchụaja fesara ọbara ha nʼelu ebe ịchụ aja. Ha gbukwara ebule ndị ahụ fesa ọbara ha nʼebe ịchụ aja, gbukwaa ụmụ atụrụ ndị ahụ fesakwa ọbara ha nʼebe ịchụ aja. Ha wetara mkpi ndị ahụ eji achụ aja mmehie nʼihu eze na ọgbakọ ahụ, ha bikwasịkwara ha aka nʼelu. Ndị nchụaja gburu mkpi ndị ahụ, chee ọbara ha nʼelu ebe nchụaja maka ikpuchi mmehie ndị Izrel niile. Nʼihi na eze nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ na aja mmehie nʼihi ndị Izrel niile. O mere ka ụfọdụ ndị Livayị nọdụ nʼụlọnsọ ahụ, dịka ndị na-abụ abụ. O nyere ha ogene, na une, na ụbọ akwara. O mere nke a nʼusoro dịka Devid na Gad, bụ ọhụ ụzọ eze, na Netan, bụ onye amụma, nke a bụ dịka ONYENWE ANYị nyererịị nʼiwu site nʼaka ndị amụma ya. Ya mere, ndị Livayị ji ihe egwu Devid ndị ahụ niile guzoro na njikere, ma ndị nchụaja jikwa opi ha nke ha na-afụ. Hezekaya nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ ahụ nʼelu ebe ịchụ aja. Mgbe a malitere isure aja ahụ ọkụ, a malitekwara ịbụ abụ nye ONYENWE ANYị, na ịfụ opi na iti ihe egwu niile nke Devid, eze Izrel. Nʼoge mmemme ọchụchụ aja ahụ, mmadụ niile kpọrọ isiala nye Chineke, mgbe ndị abụ na-abụ abụ, ndị opi na-afụkwa opi ha. Ihe niile a nọ na-eme tutu ruo mgbe a chụsịrị aja niile ahụ. Mgbe ha chụchara aja ndị ahụ, eze na ndị niile nọ nʼebe ahụ gburu ikpere nʼala, kpọkwaa isiala. Eze Hezekaya na ndịisi ozi ya nyere iwu ka ndị Livayị bụọ ụfọdụ nʼime abụ ọma Devid, na nke Asaf onye amụma, maka iji ya too ONYENWE ANYị. Ha mere otu a, kpọọkwa isiala nye Chineke. Emesịa, Hezekaya sịrị, “Ugbu a unu edoola onwe unu nsọ nye ONYENWE ANYị, bịanụ nso, webatanụ aja na onyinye ekele nʼime ụlọnsọ ONYENWE ANYị.” Ya mere, nzukọ ahụ niile wetaara aja na onyinye ekele ha, ndị niile nwere mkpebi nʼobi ha wetara aja nsure ọkụ. Ọnụọgụgụ anụ ụlọ niile ha wetara bụ ndị a: iri oke ehi asaa, na narị ebule, na narị ụmụ ebule abụọ, ka e wetara maka aja nsure ọkụ nye ONYENWE ANYị. Anụ ndị e doro nsọ maka ịchụ aja dị narị oke ehi isii na atụrụ na ewu dị puku atọ. Ma ndị nchụaja dị ole na ole, ha apụghịkwa ịgba akpụkpọ anụ niile ahụ maka aja nsure ọkụ, nʼihi ya, ụmụnne ha bụ ndị Livayị nyeere ha aka tutu ruo mgbe ozi ahụ gwụsịrị, ruokwa mgbe e doro ndị nchụaja ndị ọzọ nsọ. Nʼihi na ndị Livayị nwere obi ziri ezi karịa ndị nchụaja ido onwe ha nsọ. Aja nsure ọkụ bara ụba, tinyere abụba nke aja udo niile, na aja ihe ọṅụṅụ nke so aja nsure ọkụ ndị a. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka e si weghachite ije ozi na ịchụ aja nke na-adị nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị. Hezekaya na ndị Juda niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ihe Chineke doziri nye ndị ya, nʼihi na ihe niile ndị a mere ngwangwa.

II. IHE EMERE 29:3-36 Bible Nso (IGBOB)

Onye ahu, n'arọ mbu nke ọ bu eze, n'ọnwa mbu, o meghere uzọ ulo Jehova, me ka ha di ike. O we me ka ndi-nchu-àjà na ndi Livai bata, o we chikọbata ha n'amá ọwuwa-anyanwu, si ha, Nurunum, ndi Livai; ub͕u a donu onwe-unu nsọ, do kwa ulo Jehova, bú Chineke nna-unu-hà, nsọ, me ka idi na nsọ-unu pua n'ebe nsọ ahu. N'ihi na nna-ayi-hà mekpuru emekpu, me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ayi, ha we rapu Ya, si n'ebe-obibi Jehova chigharia iru-ha, b͕akuta azu-ha. Ọzọ, ha emechiwo ọnu-uzọ nile nke uzọ-nbata, menyu oriọna nile, ha esureghi kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ha esureghi kwa àjà-nsure-ọku, n'ebe nsọ ahu, nye Chineke Israel. Iwe Jehova we dikwasi Juda na Jerusalem, O we rara ha nye ka ha buru ihe-nkwaghari, na ibu ihe-iju-anya, na ibu ihe-ima-ọsọ, dika unu onwe-unu nēwere anya-unu hu. Ma, le, nna-ayi-hà adawo site na mma-agha, umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom na ndinyom-ayi nọ na ndọta-n'agha n'ihi nka. Ub͕u a ọ di n'obim ka ayi na Jehova, bú Chineke Israel, b͕a ndu, ka iwe-Ya nke di ọku we si n'ebe ayi nọ chigharia. Umum, ub͕u a unu ejehiela: n'ihi na ọ bu unu ka Jehova rọputara iguzo n'iru Ya, ijere Ya ozi, na iburu Ya ndi nēje ozi na ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. Ndi Livai we bilie, bú Mehat nwa Amasai, na Joel mwa Azaraia, ndi sitere n'umu ndi Kohat: na Kish nwa Abdi, na Azaraia nwa Jehalelel, ndi sitere n'umu Merari: na Joa nwa Zima, na Iden nwa Joa, ndi sitere na ndi Giashon: na Shimri na Jeuel, ndi sitere n'umu Elizafan: na Zekaraia na Matanaia, ndi sitere n'umu Esaf: na Jehuel na Shimai, ndi sitere n'umu Himan: na Shemaia na Uziel, ndi sitere n'umu Jedutum. Ha we chikọta umu-nne-ha ndikom, do onwe-ha nsọ, ba, dika ihe ahu si di nke eze nyere n'iwu, site n'okwu, ime ka ulo Jehova di ọcha. Ndi-nchu-àjà we ba n'ime-ime nke ulo Jehova, ime ka o di ọcha, ha we buputa ihe ruru árú nile nke ha chọtara n'ulo uku Jehova tiye ya n'ogige ulo Jehova. Ndi Livai we nara ya, ibupu ya je miri-iyi Kidron n'èzí. Ha we malite ido nsọ n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu, n'ubọchi nke-asatọ nke ọnwa ka ha biaruru uzọ-nbata Jehova; ha we do ulo Jehova nsọ n'ubọchi asatọ: ọ bu kwa n'ubọchi nke-iri-na-isi nke ọnwa mbu ka ha dobìri ya nsọ. Ha we ba nime biakute Hezekaia, bú eze, si, Ayi emewo ka ulo Jehova nile di ọcha, ya na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, na ihe-ya nile, na Table achicha anēdo n'usoro, na ihe-ya nile. Ihe nile kwa nke eze, bú Ehaz, juru aju mb͕e ọ bu eze mb͕e o mekpuru emekpu, ndia ka ayi doziworo, do kwa nsọ; ma, le, ha di n'iru ebe-ichu-àjà Jehova. Hezekaia, bú eze, we bilie n'isi-ututu, chikọta ndi-isi obodo, rigorue ulo Jehova. Ha we webata oke-ehi asa, na ebulu asa, na umu-aturu asa, na nkpi asa, ibu àjà-nmehie n'ihi ala-eze, na n'ihi ebe nsọ ahu, na n'ihi Juda. Ọ si umu Eron, bú ndi-nchu-àjà, ka ha sure ha ọku n'elu abe-ichu-àjà Jehova. Ha we b͕ue oke-ehi asa ahu, ndi-nchu-àjà we nara ọbara-ha, wusa n'ebe-ichu-àjà: ha b͕u-kwa-ra ebulu asa ahu, wusa ọbara-ha n'ebe-ichu-àjà: ha b͕u-kwa-ra umu-aturu ahu, wusa ọbara-ha n'ebe-ichu-àjà. Ha we weta nkpi asa nke àjà-nmehie nso n'iru eze na nkpọkọta Juda; ha we bikwasi ha aka-ha: ndi-nchu-àjà we b͕ue ha, were ọbara-ha chua àjà-nmehie n'ebe-ichu-àjà, ikpuchiri Israel nile nmehie: n'ihi na eze siri, Ọ diri Israel nile, bú àjà-nsure-ọku a na àjà-nmehie a. O we guzo ndi Livai n'ulo Jehova, ndi chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, dika ihe ahu si di nke Devid, na Gad, bú onye-ọhu-uzọ nke eze, na Netan, bú onye-amuma, nyere n'iwu: n'ihi na o sitere n'aka Jehova, bú ihe ahu enyere n'iwu, site n'aka ndi-amuma-Ya. Ndi Livai we chiri ihe Devid guzo, ndi-nchu-àjà chiri kwa opì. Hezekaia we si ka esure àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-àjà. Ma na mb͕e amalitere isure àjà-nsure-ọku, amalitere ibù abù Jehova, na ifù opì nile, na ikpọ ihe nile bu ubọ nke Devid, bú eze Israel. Nkpọkọta ahu nile nākpọ kwa isi ala, ndi-ọbù-abù nābù kwa, ndi nāfù opì nāfù kwa: anēme ihe a nile rue mb͕e achubìri àjà-nsure-ọku. Ma mb͕e ha surebìsiri àjà-nsure-ọku, eze na ndi nile ahuru n'ebe ọ nọ ruru ala, we kpọ isi ala. Hezekaia, bú eze, na ndi-isi we si ndi Livai ka ha were okwu nke Devid, na nke Esaf, bú onye-ọhu-uzọ, to Jehova. Ha we to Chineke rue ọṅù, ha we rube isi kpọ isi ala. Hezekaia we za, si, Ub͕u a unu emejuwo aka-unu n'ebe Jehova nọ, bianu nso webata àjà na àjà-ekele n'ulo Jehova. Nkpọkọta Juda we webata àjà na àjà-ekele; onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo weta-kwa-ra àjà-nsure-ọku. Ọnu-ọgugu àjà-nsure-ọku, nke nkpọkọta Juda wetara, we di ọgu oke-ehi atọ na iri, na ọgu ebulu ise, na ọgu umu-aturu iri: ndia nile bu ihe àjà-nsure-ọku ichuru Jehova. Ihe edoro nsọ di kwa nnù oke-ehi na ọgu iri, na nnù aturu asa na ọgu iri. Nání na ndi-nchu-àjà di ole-na-ole, ha apughi kwa ib͕a akpukpọ anu àjà-nsure-ọku nile: umu-nne-ha, bú ndi Livai, we me ka ha di ike, rue mb͕e ejebìri ozi ahu, ru kwa mb͕e ndi-nchu-àjà doro onwe-ha nsọ: n'ihi na ndi Livai nwere obi ziri ezi kari ndi-nchu-àjà ido onwe-ha nsọ. Ọzọ kwa, àjà-nsure-ọku bara uba, tiyere abuba nke àjà-udo nile, tiye-kwa-ra àjà-ihe-ọṅuṅu nile nke diri àjà-nsure-ọku. Ewe dozie òfùfè ulo Jehova. Hezekaia we ṅuria, ya na ndi-ya nile, n'ihi ihe nke Chineke doziri nye ndi ahu: n'ihi na ọ bu na mberede ka ihe a mere.