II. IHE EMERE 24:23-27
II. IHE EMERE 24:23-27 Bible Nso (IGBOB)
O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na usu-ndi-agha Siria rigoro imegide ya: ha we biarue Juda na Jerusalem, bilie ndi-isi nile nke ndi Juda site n'etiti ndi ahu, ha we zigara eze Damaskọs ihe-nkwata-ha nile. N'ihi na usu-ndi-agha Siria chiri ndikom ole-na-ole bia; Jehova we nye usu-ndi-agha bara uba nke-uku n'aka-ha, n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha. Ha we me Joash ihe nile ekpere n'ikpe. Ma mb͕e ha siri n'ebe ọ nọ la, (n'ihi na ha rapuru ya n'ọtutu ọria,) ndi-orù-ya kekọtara onwe-ha imegide ya n'ihi ọbara umu Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, b͕ue ya n'elu ihe-ndina-ya, o we nwua: ha we lìe ya n'obodo Devid, ma ha elìghi ya n'ílì ndi-eze. Ma ndia bu ndi nēkekọta onwe-ha imegide ya; bú Zabad nwa Shimeat nwayi Amon, na Jehozabad nwa Shimrit nwayi Moab. Ma ihe bayere umu-ya ndikom, na iba-uba nke ibu eboro ya, na ntọ-ala ulo Chineke, le, edewo ha n'akukọ akwukwọ ndi-eze. Amazaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
II. IHE EMERE 24:23-27 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ruo ka ọ gbara otu afọ, ndị agha Aram bịara imegide Joash, ha wakporo Juda na Jerusalem gbuo ndị ndu niile site nʼetiti ndị mmadụ. Ha zigaara eze ha nọ na Damaskọs ihe niile ha kwatara nʼike. Nʼagbanyeghị na ndị Aram kpọọ naanị ndị ikom ole na ole bịa, ONYENWE ANYị raara igwe ndị agha dị ukwuu ranye ha nʼaka. Nʼihi na Juda gbakụtara ONYENWE ANYị azụ, bụ Chineke nke nna nna ha, e mezuru ihe niile e kpere nʼikpe nʼahụ Joash. Mgbe ndị agha Aram lara, hapụ Joash nʼọnọdụ mmerụ ahụ dị ukwuu, ndịisi ozi ya gbara izu gbuo ya, nʼihi ogbugbu o gburu nwa Jehoiada, onye nchụaja. Ha gburu ya mgbe o dina nʼihe ndina ya. Emesịa, ha liri ya nʼobodo Devid, ma ọ bụghị nʼebe a na-eli ndị eze. Ndị gbara izu gbuo ya bụ Zabad, onye nne ya bụ Shimeat onye Amọn, na Jehozabad, onye nne ya bụ Shimrit onye Moab. Ihe niile gbasara Joash na ụmụ ya, na amụma niile e buru banyere ya, na otu e si wuzie ụlọnsọ ukwu Chineke, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel niile. Mgbe Joash nwụrụ, Amazaya nwa ya ghọrọ eze Juda.