II. IHE EMERE 24:1-22
II. IHE EMERE 24:1-22 Bible Nso (IGBOB)
Joash b͕ara arọ asa mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na Jerusalem: aha nne-ya bu Zibia nke Bia-sheba. Joash we me ihe ziri ezi n'anya Jehova ubọchi nile nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà. Jehoiada we lutara ya ndinyom abua; o we mua umu-ndikom na umu-ndinyom. O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na ọ di n'obi Joash ime ka ulo Chineke di ọhu. O we chikọta ndi-nchu-àjà na ndi Livai, si ha, Puanu, jerue obodo nile nke Juda, chikọputa ego n'Israel nile ime ka ulo Chineke-unu di ike kwa-arọ, unu onwe-unu kwa, menu ngwa ime ihe ahu. Ma ndi Livai emeghi ngwa. Eze we kpọ Jehoiada, bú onye-isi, si ya, Gini mere i jughi ndi Livai ka ha si na Juda, si kwa na Jerusalem, webata ùtú nke Moses, bú orù Jehova, na nke nkpọkọta nke Israel, nke diri ulo-ikwū ihe-àmà? N'ihi na Atalaia, bú nwayi ahu nēmebi iwu, umu-ya ndikom tipúru ulo Chineke; ọzọ kwa, ha were ihe nsọ nile nke ulo Jehova nye Bealim. Eze we gwa ha, ha we me otù ib͕e, dọba ya n'ọnu-uzọ-ama ulo Jehova n'èzí. Ha we kpọsa na Juda na nime Jerusalem, ka ewebatara Jehova utu nke Moses, bú orù Chineke, tukwasiri Israel n'ọzara. Ndi-isi nile na ndi Juda nile we ṅuria ọṅu, webata ihe, tubà ya n'ib͕e ahu, rue mb͕e ha nyebìri. O rue, mb͕e ebubatara ib͕e ahu n'ulo-nlekọta eze site n'aka ndi Livai, mb͕e ha hu-kwa-ra na ego ahu riri nne, na ode-akwukwọ eze na onye-nlekọta nke onye-isi-nchu-àjà biara, wupu ihe di n'ib͕e, būru ya, bughachi ya n'ọnọdu-ya. Otú a ka ha mere kwa-ubọchi, ha we chikọta ego n'uba. Eze na Jehoiada we were ya nye ndi nēje ozi òfùfè ulo Jehova; ha we nēgo ndi nāwa nkume na ndi-ọ̀kà n'osisi ime ka ulo Jehova di ọhu, ha were kwa ya nye ndi-ọ̀kà n'ígwè na ọla ime ka ulo Jehova di ike. Ndi nēje ozi ahu we lua ọlu, ewe jezue ozi ahu n'aka-ha, ha we guzo ulo Chineke dika ọtùtù-ya si di, me ka o sie ike. Mb͕e ha lubìri, ha we weta n'iru eze na Jehoiada ego fọduru, ha we were ya mere ulo Jehova ihe, bú ihe ozi, na isure àjà-nsure-ọku, na ngaji, na ihe ọla-edo na ọla-ọcha. Ha we nēsure àjà-nsure-ọku n'ulo Jehova mb͕e nile ubọchi nile nke Jehoiada. Jehoiada we ghọ agadi, ubọchi ndu-ya we ju ya afọ, o we nwua; ọgu arọ isi na iri ka ọ b͕ara mb͕e ọ nwuru. Ha we lìe ya n'obodo Devid n'etiti ndi-eze, n'ihi na o mere ezi ihe n'Israel, na n'ebe Chineke na ulo-Ya di. Ma mb͕e ọnwu Jehoiada gasiri, ndi-isi Juda biara, kpọ isi ala nye eze. Mb͕e ahu eze gere ha nti. Ha we rapu ulo Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, we fè Asherim na arusi òfùfè: iwe we dikwasi Juda na Jerusalem n'ikpe-ọmuma-ha nka. O zite ndi-amuma n'etiti ha, ime ka ha laghachikute Jehova; ha we b͕a àmà megide ha: ma ha aṅaghi nti. Mọ Chineke we were Zekaraia nwa Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, kpuchie Onwe-ya dika uwe; o we guzo n'elu n'ebe ndi Juda nọ, si ha, Otù a ka Chineke siri; N'ihi gini ka unu onwe-unu nāgabiga ihe nile Jehova nyere n'iwu, ihe we ghara igara unu nke-ọma? n'ihi na unu arapuwo Jehova, Ọ rapuwo kwa unu. Ha we kekọta onwe-ha imegide ya, were nkume tub͕ue ya, n'ihi ihe eze nyere n'iwu, n'ogige ulo Jehova. Joash, bú eze, echetaghi kwa ebere nke Jehoiada, bú nna-ya, mere ya, o we b͕ue nwa-ya. Ma mb͕e ọ nwuru, ọ si, Ka Jehova hu ya, ju ase.
II. IHE EMERE 24:1-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Joash gbara afọ asaa mgbe e mere ya eze, ọ chịrị iri afọ anọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zibịa onye Bịasheba. Joash mere ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYị nʼafọ niile nke Jehoiada bụ onye nchụaja, dị ndụ. Jehoiada lụtaara ya ndị inyom abụọ, ndị mụtaara ya ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Joash kpebiri ime ka ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị dị ọhụrụ. Ọ kpọkọtara ndị nchụaja na ndị Livayị niile sị ha, “Gaanụ nʼobodo Juda niile nakọta ego ụtụ afọ nʼaka ndị Izrel niile, maka iwuzi ụlọnsọ Chineke unu. Meenụ ya ugbu a.” Ma ndị Livayị emeghị ya ngwangwa. Ya mere, eze kpọrọ Jehoiada bụ onyeisi nchụaja sị ya, “Gịnị mere i mebeghị ka ndị Livayị gaa nakọtaa, site nʼaka ndị bi nʼobodo Juda niile, na nʼobodo Jerusalem, ego ụtụ nke Mosis ohu ONYENWE ANYị na ọgbakọ ụmụ Izrel nyere nʼiwu maka ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ?” Nʼoge a ụmụ ndị ikom Atalaya, nwanyị ọjọọ ahụ tipuru ụlọnsọ Chineke, bukọrọ ihe nsọ niile e ji efe ONYENWE ANYị dị nʼime ya maka Baal. Ya mere, eze nyere iwu ka e wuo igbe onyinye, nke a ga-adọba nʼọnụ ụzọ e si abanye ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị. A kpọsara ya na Juda na Jerusalem niile sị ka ha wetara ONYENWE ANYị ụtụ nke Mosis ohu Chineke kwagidere ụmụ Izrel nʼọzara na ha ga na-atụ. Ndịisi na ndị mmadụ niile jiri obi ụtọ tụta ụtụ ha. Ha jiri onyinye ha bịa tụnye ha nʼigbe onyinye ahụ, tutu rụọ mgbe o juru nʼọnụ. Mgbe ọbụla ndị Livayị bubataara ndị ozi eze igbe ahụ, ha hụ na-atụjuola ya ego, ode akwụkwọ eze ya na onyeozi nke onyeisi nchụaja ga-awụpụta ihe dị nʼigbe, ma bughachi okpokoro igbe ahụ nʼọnọdụ ya. Otu a ka ha mere ọtụtụ oge ruo mgbe ha nwetara ọtụtụ ego dị ukwuu. Eze na Jehoiada weere ego ahụ niile nyefee ha nʼaka ndị ọrụ ụlọ ONYENWE ANYị dị nʼaka, ha chọtara ndị ọka na-edo nkume, na ndị ọkpọ ǹtu. Ha tinyere ọrụ ime ka ụlọnsọ ahụ dị ọhụrụ nʼaka ndị a. Ha gokwara ndị ụzụ bịara kpụọ ihe niile gbasara bronz na igwe e ji rụọ ọrụ ahụ. Ndị e nyefere ọrụ ahụ nʼaka ji obi ha niile rụọ ọrụ nke mere na ọrụ ahụ gara nʼihu nke ọma. Ha rụziri ụlọnsọ ukwu Chineke dịka atụmatụ ya mbụ si dị, meekwa ya ka o sie ike karịa. Mgbe ha rụsịrị ọrụ niile, ha weghachitere ego fọdụrụ, nye ya eze na Jehoiada, ha were ya rụta ngwa ije ozi maka ụlọnsọ ONYENWE ANYị, ngwa ije ozi na ihe isure aja nsure ọkụ, na ngaji, ya na efere dị iche iche, na ihe ọlaọcha na ọlaedo. A na-achụ aja nsure ọkụ nʼụlọnsọ nye ONYENWE ANYị ụbọchị niile Jehoiada dị ndụ. Ma Jehoiada mere nnọọ agadi, jupụtakwa nʼọtụtụ afọ, ọ nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri afọ atọ. E liri ya nʼebe a na-eli ndị eze nʼobodo Devid nʼihi ihe ọma niile o meere Izrel na Chineke na ụlọnsọ ya. Mgbe Jehoiada nwụsịrị, ndịisi Juda bịara ịkwanyere eze Joash ugwu. O gekwara ha ntị. Ha hapụrụ ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị Chineke nna nna ha, fee ogidi Ashera na arụsị ndị ọzọ. Nʼihi ikpe ọmụma ha wetaara onwe ha, iwe Chineke dakwasịrị Juda na Jerusalem. ONYENWE ANYị zitere ọtụtụ ndị amụma, ndị bịara buo amụma maka ịkpọghachi ha azụ, ma ha mesiri obi ha ike, jụ ige ntị. Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị Zekaraya nwa Jehoiada onye nchụaja. O guzoro nʼihu ọha na eze gwa ha okwu sị; “Otu a ka Chineke sịrị, ‘Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu ONYENWE ANYị? Ihe agaghị agara unu nke ọma. Unu agbakụtala ONYENWE ANYị azụ, ugbu a, ya onwe ya agbakụtakwala unu azụ.’ ” Ma ndịisi Juda niile gbara izu megide ya, sitekwa nʼiwu eze nyere ha ji nkume tugbuo ya nʼogige ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị. Eze Joash echetaghị ebere nke nna Zekaraya bụ Jehoiada meere ya kama o gburu nwa ya. Ma mgbe ọ na-anwụ, ọ sịrị, “Ka ONYENWE ANYị hụkwa mmeso ọjọọ a ma kwụọkwa unu ụgwọ ajọ omume unu niile.”