II. IHE EMERE 12:13-14
II. IHE EMERE 12:13-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Eze Rehoboam mere onwe ya ka ọ dị ike na Jerusalem na-achịkwa ka eze. Ọ gbara iri afọ anọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị afọ iri na asaa na Jerusalem, bụ obodo ahụ ONYENWE ANYị họọrọ site nʼetiti ebo niile nke Izrel, bụ ebe ọ ga-akpọkwasị Aha ya. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn. O mere ihe ọjọọ, nʼihi na ọ dịghị mgbe ọbụla o kpebiri nʼobi ya ịchọ ONYENWE ANYị.
Kesaa
Gụọ II. IHE EMERE 12II. IHE EMERE 12:13-14 Bible Nso (IGBOB)
Eze, bú Rehoboam, we me onwe-ya ka ọ di ike na Jerusalem, o we buru eze: n'ihi na Rehoboam b͕ara ọgu arọ abua na otù mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri-na-asa na Jerusalem, bú obodo ahu nke Jehova rọputara n'ebo nile nke Israel, ido aha-Ya n'ebe ahu: aha nne-ya bu Neama nwayi Amon. O we me ihe ọjọ, n'ihi na o dozighi obi-ya ichọ Jehova.
Kesaa
Gụọ II. IHE EMERE 12