II. IHE EMERE 11:5-17
II. IHE EMERE 11:5-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Rehoboam bigidere na Jerusalem wusie obodo ndị dị na Juda ike nʼihi nchedo. Obodo ndị a bụ Betlehem, Etam, Tekoa, Bet Zoa, Soko, Adulam, Gat, Maresha, Zif, na Adoraim, Lakish, Azeka Zora, Aijalon na Hebrọn. Obodo ndị a bụkwa obodo ndị Juda na Benjamin e wusiri ike. O wusiri ha ike tinye ndịisi agha nʼime ha, tinyekwa ihe oriri na mmanụ oliv na mmanya. O tinyere ọta na ùbe nʼebe niile a na-edebe ngwa agha nʼobodo niile, nʼihi iche obodo ya nke ọma, ebe ọ bụ naanị Juda na Benjamin nọ nʼokpuru ya. Ma ndị nchụaja niile na ndị Livayị ndị sitere nʼakụkụ niile nke Izrel dịnyere ya. Ndị Livayị hapụchara ebe ịta nri anụ ụlọ ha na ihe niile ha nwere bịa biri na Juda na Jerusalem, nʼihi na Jeroboam na ụmụ ya ndị ikom jụrụ ha dịka ndị nchụaja ONYENWE ANYị. Ọ họpụtara ndị nchụaja nke aka ya, maka ebe niile dị elu, nakwa ife arụsị ewu na nwa ehi ndị ahụ ọ kpụrụ. Ndị si nʼebo niile nke Izrel, ndị kpebiri nʼobi ha ịchọ ONYENWE ANYị, Chineke Izrel sooro ndị Livayị bịa Jerusalem ịchụ aja nye ONYENWE ANYị Chineke nna nna ha. Ha mere ka alaeze Juda sie ike. Ha kwagidekwara Rehoboam nwa Solomọn afọ atọ, na-agbasokwa nʼụzọ niile nke Devid na Solomọn nʼoge a.
II. IHE EMERE 11:5-17 Bible Nso (IGBOB)
Rehoboam we biri na Jerusalem, wue obodo ufọdu ib͕ochi agha nime Juda. O wue Bet-lehem, na Itam, na Tekoa, na Bet-zua, na Soko, na Adulam, na Gat, na Marisha, na Zif, na Adoraim, na Lekish, na Azeka, na Zora, na Ajalon, na Hebron, nke di na Juda na Benjamin, bú obodo ewusiri ike. Ọ we me ka ebe nile ewusiri ike di ike, tiye ndi-ndú nime ha, na àkù, bú ihe-oriri, na manu, na manya-vine. O tiye-kwa-ra ọta na ube n'obodo nile ọ bula, we me ka ha di ike ri nne. O we nwe Juda na Benjamin. Ndi-nchu-àjà na ndi Livai ndi nọ n'Israel nile we si n'ókè-ala-ha nile guzo onwe-ha n'akuku ya. N'ihi na ndi Livai rapuru ebe-ita-nri-anu nile ha na ihe-onwunwe-ha, we jerue Juda, jeru kwa Jerusalem: n'ihi na Jeroboam na umu-ya ndikom juru ha, ka ha ghara iburu Jehova ndi-nchu-àjà: ọ we guzoro onwe-ya ndi-nchu-àjà idiri ebe di elu, na idiri nkpi, na idiri umu-ehi, nke o mere. Site n'ebo nile nke Israel ndi nēnye obi-ha ichọ Jehova, bú Chineke Israel, so-kwa-ra ha bia na Jerusalem ichuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, àjà. Ha we me ka ala-eze Juda di ike, ha b͕a kwa Rehoboam nwa Solomon ume, arọ atọ: n'ihi na ha jere ije n'uzọ Devid na Solomon arọ atọ.