II. IHE EMERE 11:18-23
II. IHE EMERE 11:18-23 Bible Nso (IGBOB)
Rehoboam we lutara onwe-ya nwunye, bú Mahalat nwa-nwayi Jerimot nwa Devid, na Abihail nwa-nwayi Elaiab nwa Jesi, o we muara ya umu-ndikom; Jeush, na Shemaria, na Zaham. Mb͕e ọ lusiri ya ọ luta-kwa-ra Meaka nwa-nwayi Absalom; o we muara ya Abaija, na Atai, na Ziza, na Shelomit. Rehoboam we hu Meaka nwa Absalom n'anya kari ndinyom-ya nile na iko-ya ndinyom nile: (n'ihi na ndinyom iri na asatọ ka ọ lutara, nwe kwa ọgu iko-ndinyom atọ, o we mua orú umu-ndikom na asatọ na ọgu umu-ndinyom atọ). Rehoboam we guzo Abaija nwa Meaka ibu onye-isi, ọbuná ibu onye-ndú n'etiti umu-nne-ya: n'ihi na ọ di n'obi-ya ime ya eze. O nwe-kwa-ra nghọta, we me ka ufọdu nime umu-ya ndikom nile b͕asa rue ala nile nke Juda na Benjamin, rue obodo ọ bula ewusiri ike: o we nye ha nri n'uba. O we chọ ìgwè ndinyom.
II. IHE EMERE 11:18-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Rehoboam, lụrụ Mahalat, bụ nwa nwanyị Jerimot nwa Devid, na Abihail, nwa nwanyị Eliab, nwa Jesi. Ọ mụtaara ya ụmụ ndị ikom atọ ndị a: Jeush, na Shemaraya, na Zaham. Emesịa, ọ lụkwara nwunye ọzọ aha ya bụ Maaka, nwa nwanyị Absalọm. Ụmụ ha mụtara bụ Abija, na Atai, na Ziza, na Shelomit. Rehoboam hụrụ Maaka nwa nwanyị Absalọm nʼanya karịa ndị nwunye ya na ndị iko ya nwanyị niile. O nwere ndị nwunye iri na asatọ, nweekwa iri ndị iko nwanyị isii. Ọ mụtara iri ndị ikom abụọ na asatọ, na iri ụmụ nwanyị isii. Rehoboam mere Abija nwa Maaka onyeisi nʼetiti ụmụ eze niile nʼihi na ọ chọrọ ime ya eze. O ji ezi uche zipụchaa ụmụ ya ndị ikom gaa nʼala ndị Juda na Benjamin, nakwa nʼobodo ndị ahụ e wusiri ike. O nyere ha ihe e ji elekọta ndụ nʼebe ọ bara ụba ma lụọkwara ha ọtụtụ ndị inyom.