II. IHE EMERE 1:2-6
II. IHE EMERE 1:2-6 Bible Nso (IGBOB)
Solomon we gwa Israel nile okwu, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na nke usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-ikpe, na onye-isi ọ bula nke Israel nile, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna. Solomon, ya na nkpọkọta ahu nile, we jerue ebe di elu nke di na Gibeon; n'ihi na n'ebe ahu ka ulo-ikwū nzute nke Chineke di, bú nke Moses, bú orù Jehova, mere n'ọzara. Ma Devid siri na Kiriat-jearim bugota ib͕e Chineke rue ọnọdu nke Devid doziri ya: n'ihi na ọ mara ulo-ikwū nye ya nime Jerusalem. Ma ebe-ichu-àjà ọla ahu, nke Bezalel nwa Uri, nwa Hua, mere, di n'ebe ahu n'iru ebe-obibi Jehova: Solomon na nkpọkọta ahu we chọ ya. Solomon we rigo n'ebe ahu rue ebe-ichu-àjà ọla n'iru Jehova, nke di n'ulo-ikwū nzute, o we sure nnù àjà-nsure-ọku abua na ọgu iri n'elu ya.
II. IHE EMERE 1:2-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, Solomọn gwara ndị Izrel niile okwu, ya bụ, ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndị ikpe, na ndị ndu niile nọ nʼIzrel, na ndịisi ezinaụlọ niile. Solomọn ya na ọgbakọ ahụ niile, gara nʼebe dị elu nke Gibiọn, nʼihi nʼebe ahụ ka ụlọ nzute Chineke dị, bụ nke Mosis onyeozi ONYENWE ANYị wuru nʼọzara. Ma Devid esitelarị na Kiriat Jearim buputa igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, bulaa ya nʼụlọ ikwu nke o wuru maka ya na Jerusalem. Ebe ịchụ aja bronz ahụ Bezalel nwa Uri, nwa Hua wuru dịkwa na Gibiọn, nʼihu ụlọ nzute ONYENWE ANYị. Solomọn na ọgbakọ ahụ na-ajụta ya ase nʼebe bronz ahụ. Solomọn jere nʼebe ịchụ aja ahụ e ji bronz kpụọ, nke dị nʼihu ONYENWE ANYị, nʼime ụlọ nzute, jiri anụ ụlọ ọnụọgụgụ ha dị otu puku chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ya.