Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. TIMỌTI 5:1-16

I. TIMỌTI 5:1-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Abarala okenye mba nʼolu dị ike, kama jiri arịrịọ na nsọpụrụ gwa ya okwu dị ka ọ bụ nna gị. Na-agwa ụmụ okorobịa okwu dị ka ị ga-esi gwa ụmụnne gị ị hụrụ nʼanya okwu. Na-emeso ndị inyom ndị bụ okenye omume dị ka ndị nne, ma na-emesokwa ụmụ agbọghọ omume dị ka ị ga-esi mesoo ụmụnne gị nwanyị omume. Na-echekwa uche nʼịdị ọcha nʼebe o zuruoke. Sọpụrụnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, ndị na-ebi ndụ dị ka ndị di ha nwụrụ anwụ nʼeziokwu. Kama ọ bụrụ na nwanyị ọbụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, maọbụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesiri ibu mkpa ha. Nʼihi na anyị kwesiri isite nʼụlọ anyị gosi obiọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nʼihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ. Nwanyị di ya nwụrụ nʼezie, nke na-enweghị onye na-elekọta ya anya, atụkwasịla obi ya na olileanya na Chineke. Ọ na-anọgidekwa nʼekpere na arịrịọ ehihie na abalị. Ma nwanyị di ya nwụrụ nke weere onwe ya nyefee nʼaka ịgbaso ihe na-eme ya obi ụtọ bụrịị onye nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ. Nye ha ihe ndị a dịka iwu, ka ha ghara ị bụ ndị a na-ata ụta. Onye ọbụla na-adịghị egboro ndị ikwu ya, karịchasịa ndị ezinaụlọ nke aka ya ihe na-akpa ha mkpa, ajụla okwukwe ahụ ma jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe na njọ. Nwanyị ọbụla di ya nwụrụ ga-aba nʼotu ndị di ha nwụrụ ga-abụ onye gbara iri afọ isii maọbụ karịa. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ naanị otu di. Ọ ga-abụ onye mmadụ niile na-agbara ezi ama, nʼihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nʼụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, onye na-asa ụkwụ ndị nsọ na onye jikeere mgbe niile ime ihe ọma. Ma o kwesighị ka e debanye aha ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nʼotu ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ. Nʼihi na mgbe ọchịchọ anụ ahụ jidesiri ha ike, ha ga-enupuru Kraịst isi, chọwa ịlụ di ọzọ. Ụdị omume a ga-ewetara ha ikpe ọmụma, nʼihi na ha emezughị nkwa ha kwere na mbụ. Wezugakwarị nke a, na ha amụta omume ịdị umengwụ, nʼaga nʼụlọ dị iche iche. Ọ bụghị naanị na ha bụ ndị na-adịghị arụ ọrụ, kama ha na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha, na-akpa asịrị, na-ekwu okwu nzuzu, na-ekwu ihe ha ekwesighị ikwu. Nʼihi nke a, ana m adụ ndị ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ ọdụ ka ha lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinaụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye iro ọbụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide anyị. Ụfọdụ ndị mmadụ adahielarị ụzọ, soro ekwensu. Ya mere, nwanyị ọbụla kwere ekwe, nke nwere nʼezinaụlọ ya ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, ya jisie ike gboro ha mkpa. Ọ dịghị mma ibogbu chọọchị nʼibu, ka o nwee ike iletazu ndị nọ nʼọnọdụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ nʼezie.

I. TIMỌTI 5:1-16 Bible Nso (IGBOB)

Abarala okenye oké nba, kama nāriọ ya aririọ dika nna; nēmeso kwa umu-okorọbia dika umu-nne: ndinyom, ndi bu okenye, dika ndi bu nne; umu-ab͕ọghọ dika umu-nne-nwanyi, n'idi-ọcha nile. Nāsọpuru ndinyom di-ha nwuru, bú ndi nọ ezie n'ọnọdu ndinyom di-ha nwuru. Ma ọ buru na nwanyi ọ bula di-ya nwuru nwere umu ma-ọbu umu umu, ka ha buru uzọ muta isọpuru Chineke n'aru ndi èzí-na-ulo nke aka ha, na inyeghachi ndi muru ha ihe: n'ihi na nka bu ihe anānara nke-ọma n'iru Chineke. Ma nwanyi nke bu onye di-ya nwuru n'ezie, nke arapu-kwa-ra nání ya, ọ tukwasiwo obi-ya na Chineke, nānọgide kwa n'aririọ-ya na ekpere-ya abali na ehihie. Ma nwanyi nke nādi ndu ọjọ dika ọ nātọ aru-ya utọ, ọ nwuruwo mb͕e ọ nọ na ndu. Nēnye kwa ihe ndia n'iwu, ka ha we buru ndi anādighi-akalu. Ma ọ buru na onye ọ bula ebughi uzọ chère ndi nke aka ya ihe nākpa ha, ma nke kachasi ndi èzí-na-ulo nke aka ya, ọ gọnariwo okwukwe-ayi, jọkari kwa onye nēkweghi ekwe na njọ. Ka aghara ide aha nwanyi ọ bula n'akwukwọ dika nwanyi di-ya nwuru nke akāb͕aghi ọgu arọ atọ, onye buworo nwunye nke otù di, onye anāb͕ara ya ezi àmà n'ọlu ọma; ọ buru na ọ zùputawo umu, ọ buru na o lewo ndi-ọbìa anya nke-ọma, ọ buru na ọ sawo ukwu ndi nsọ, ọ buru na o b͕owo nkpà ndi anākpab͕u, ọ buru na o sosiwo ezi ọlu nile ọ bula ike. Ma ju umu-ab͕ọghọ di-ha nwuru: n'ihi na mb͕e ọ bula ha nupuru isi n'okpuru Kraist-ayi, ha nāchọ ilu di; ewe ma ha ikpé, n'ihi na ha juru okwukwe mbu ha. Ma tukwasi ihe ndia ha nāmuta kwa ibu ndi nādighi-alu ọlu, nēje n'ulo di iche iche; ma ọ bughi nání na ha bu ndi nādighi-alu ọlu, kama ha bu kwa ndi nēkwu okwu nzuzu, buru kwa ndi nētiye aka n'ọlu nābughi nke aka ha, nēkwu okwu nēkwesighi ka ha kwu. Ya mere anamezube ka umu-ab͕ọghọ ndi di-ha nwuru luru di, mu kwa umu, nāchi kwa èzí-na-ulo-ha, ghara kwa inye onye nēmegide ayi ihe o gēji kwutọ: n'ihi na ufọdu ejehiewo uzọ so Setan ub͕u a. Ọ buru na nwanyi ọ bula nke kwere ekwe nwere ndinyom di-ha nwuru, ya b͕o ha nkpà, ka aghara kwa ibob͕u nzukọ Kraist; ka o we b͕o ndi ahu nkpà, bú ndi nọ n'ezie n'ọnọdu ndinyom di-ha nwuru.