I. NDI TESALỌNAIKA 5:16-22
I. NDI TESALỌNAIKA 5:16-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Na-aṅụrịnụ ọṅụ oge niile. Na-ekpenụ ekpere oge niile na-esepụghị aka. Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs. Unu emenyụla ọkụ Mmụọ Nsọ. Ọzọ unu eledala okwu ndị amụma anya. Kama na-anwalenụ ihe niile ma na-ejidesikwanụ ihe niile dị mma aka ike. Wezuganụ onwe unu nʼihe ọjọọ niile.
I. NDI TESALỌNAIKA 5:16-22 Bible Nso (IGBOB)
Nāṅurinu ọṅu mb͕e nile; nēkpenu ekpere nēwepughi aka; nēkelenu ekele n'ihe nile ọ bula: n'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ nime Kraist Jisus n'ebe unu nọ. Unu emenyula Mọ Nsọ; unu akpọla ibu-amuma ihe-efu; nānwanu ihe nile; jidesienu ihe ọma ike; unu etiyela aka n'aha ajọ ihe ọ bula.