I. SAMUEL 31:4-5
I. SAMUEL 31:4-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.” Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya. Mgbe onye na-ebu ihe agha Sọl hụrụ na ọ nwụọla, ya onwe ya dakwasịkwara nʼelu mma agha nke ya, soro Sọl nwụọ.
Kesaa
Gụọ I. SAMUEL 31I. SAMUEL 31:4-5 Bible Nso (IGBOB)
Sọl we si onye nēbu ihe-agha-ya, Miputa mma-agha-gi, were ya mapuem aru; ka ndia anēbìghi úgwù ghara ibia mapuem aru, we kwam emò. Ma onye nēbu ihe-agha-ya ekweghi; n'ihi na ọ nātu egwu nke-uku. Sọl we were mma-agha-ya, dakwasi ya. Onye nēbu ihe-agha-ya we hu na Sọl anwuwo, ya onwe-ya we dakwasi kwa na mma-agha-ya, soro ya nwua.
Kesaa
Gụọ I. SAMUEL 31