I. SAMUEL 3:7-9
I. SAMUEL 3:7-9 Bible Nso (IGBOB)
Ma Samuel akāmaghi Jehova, akēkpugheghi kwa okwu Jehova nye ya. Jehova we kpọ Samuel òkù ọzọ nke ub͕ò atọ. O we bilie, jekuru Ilai, si, Lem; n'ihi na i kpọrọm òkù. Ilai we ghọta na Jehova nākpọ nwa-okoro ahu òkù. Ilai we si Samuel, Je, dina ala: ọ gēru kwa, ọ buru na Ọ kpọ gi òkù, na i gāsi, Kwue, Jehova; n'ihi na orù-Gi nānu. Samuel we je, dina ala n'ebe-ya.
I. SAMUEL 3:7-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma Samuel amatabeghị onye ONYENWE ANYị bụ, ekpughebeghị okwu ONYENWE ANYị nye ya. ONYENWE ANYị kpọrọ ya oku nke ugbo atọ; ọzọkwa Samuel biliri jekwuru Elayị sị ya, “Lee m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?” Mgbe ahụ, Elayị ghọtara na ọ bụ ONYENWE ANYị na-akpọ nwantakịrị ahụ, nʼihi ya ọ gwara Samuel okwu sị, “Laghachi, dinaa ala. Ọ bụrụ na ọ kpọọ gị ọzọ, sị ya, ‘Lee m, kwuo, ONYENWE ANYị, nʼihi na ohu gị na-ege ntị.’ ” Ya mere Samuel laghachiri gaa dinaa ala.