I. SAMUEL 24:5-6
I. SAMUEL 24:5-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Emesịa, obi Devid malitere ịma ya ikpe nʼihi na o bipụrụ ọnụ ọnụ uwe mwụda Sọl. Ọ gwara ndị ya na ha so okwu sị, “ONYENWE ANYị ekwela na m ga-emeso nna m ukwu, onye ONYENWE ANYị tere mmanụ mmeso dị otu ahụ, maọbụ na m ga-eweli aka imegide ya. Nʼihi na onye ONYENWE ANYị tere mmanụ ka ọ bụ.”
Kesaa
Gụọ I. SAMUEL 24I. SAMUEL 24:5-6 Bible Nso (IGBOB)
O rue, ka emesiri, na obi Devid tara ya uta, n'ihi na o bipuru ọnu-ọnu uwe-nwuda Sọl nwere. Ọ si ndikom-ya, Ya burum ihe-árú site na Jehova; m'gaghi-eme onye-nwem, bú onye Jehova etere manu, ihe a ma-ọli, bú iseti akam megide ya, n'ihi na onye Jehova etere manu ka ọ bu.
Kesaa
Gụọ I. SAMUEL 24