Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 24:1-22

I. SAMUEL 24:1-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe Sọl sitere nʼịlụso ndị Filistia agha lọta, a gwara ya sị, “Devid nọ nʼọzara En-Gedi.” Sọl chịịrị puku ndị agha atọ a zụrụ nke ọma site nʼIzrel niile, pụọ ịchọ Devid na ndị ikom ya nʼetiti ọgba nkume, na nʼakụkụ ụzọ dị warawara nke Ewu Ọhịa. Mgbe ọ bịaruru nso nʼọgba atụrụ nke dị nʼụzọ ahụ, otu ọgba nkume dị nʼebe ahụ, Sọl banyere nʼime ya, ịga mposi. Devid na ndị ikom ya nọ nʼime ime ọgba nkume ahụ. Ndị ikom Devid sịrị ya, “Ahaa ugbu a bụ oge gị! Taa bụ ụbọchị ahụ ONYENWE ANYị kwuru okwu ya, mgbe ọ sịrị, ‘Aghaghị m inyefe gị onye iro gị nʼaka, ka i mee ya dịka o si masị gị.’ ” Ma Devid ji nwayọọ gaa nso ebe Sọl nọ bipụ ọnụ ọnụ uwe mwụda ya. Emesịa, obi Devid malitere ịma ya ikpe nʼihi na o bipụrụ ọnụ ọnụ uwe mwụda Sọl. Ọ gwara ndị ya na ha so okwu sị, “ONYENWE ANYị ekwela na m ga-emeso nna m ukwu, onye ONYENWE ANYị tere mmanụ mmeso dị otu ahụ, maọbụ na m ga-eweli aka imegide ya. Nʼihi na onye ONYENWE ANYị tere mmanụ ka ọ bụ.” Devid sitere nʼokwu ndị a o kwuru baara ndị so ya mba. O nyeghị ha ohere ibuso Sọl agha. Emesịa, Sọl hapụrụ ọgba nkume ahụ. Mgbe Sọl si nʼọgba nkume ahụ pụọ ịga nʼihu nʼije ya, Devid sitere nʼime ọgba nkume ahụ pụta, kpọọ Sọl oku sị ya, “Onyenwe m, eze!” Sọl tụgharịrị ma Devid kpọrọ isiala nye ya, daa nʼala kpuo ihu ya nʼala. Mgbe ahụ Devid gwara Sọl okwu sị, “Gịnị mere i ji na-aṅa ntị nʼokwu ndị mmadụ na-ekwu, ndị ahụ na-asị Devid na-achọ ụzọ ọ ga-esi merụọ gị ahụ? Taa, i jirila anya gị hụ na ọ bụghị eziokwu. ONYENWE ANYị nyere gị nʼaka m nʼime ọgba nkume ahụ ị banyere, ụfọdụ ndị mụ na ha so gwara m ka m gbuo gị, ma ahapụrụ m gị ndụ nʼihi na m sịrị, ‘Agaghị m eweli aka m megide nna m ukwu nʼihi na ọ bụ onye ONYENWE ANYị tere mmanụ.’ Lee, nna m, lee iberibe uwe mwụda gị nʼaka m. Ebipụtara m ọnụ ọnụ uwe gị, ma egbughị m gị. Jiri nke a ghọta ma matakwa na ikpe nnupu isi na ajọ omume megide gị amaghị m. O nweghị ụzọ m si mejọọ gị, ma ị nọ na-achọsikwa m ike iwere ndụ m. Ka ONYENWE ANYị kpebie nʼetiti mụ na gị, ka ONYENWE ANYị bọọ ọbọ ihe ọjọọ niile i mere. Ma agaghị m emetụ gị aka. Dịka ilu ndị mgbe ochie si dị, ‘Ihe ọjọọ na-esi nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ,’ ma agaghị m emetụ gị aka. “Ma onye kwanụ ka eze Izrel na-achọ ijide? Onye ka ọ na-atụfu oge ya ịchọgharị? Ọ bụ ozu nkịta? Ka ọ bụ akpị? Ka ONYENWE ANYị bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị, ya kpebiekwa okwu anyị. Ya leba okwu m anya kpepụta m, ya gosi na m bụ onye ikpe na-amaghị site nʼịnapụta m nʼaka gị.” Mgbe Devid kwuchara okwu ndị a, Sọl zara sị ya, “Ọ bụ olu Devid nwa m dị nke ahụ?” Ọ malitekwara ịkwa akwa. Ọ sịrị Devid, “Ị bụ ezi mmadụ karịa m, nʼihi na i jirila ezi omume kwụghachi m ajọ omume m. E, i gosila m oke obi ebere taa, nʼihi na mgbe ONYENWE ANYị nyefere m nʼaka gị, ị gbughị m. Ebee ka onye ahụ nọ nʼụwa niile, nke pụrụ ịhapụ onye iro ya mgbe ọ mara nʼọnya ya? Ka ONYENWE ANYị kwụghachi gị ezi ihe nʼihi obi ebere i gosiri m taa. Ugbu a, amatala m na ị ghaghị ịbụ eze, ị ga-achịkwa alaeze Izrel. Biko, ṅụọra m iyi nʼaha ONYENWE ANYị na mgbe oge ahụ ruru, na ị gaghị egbu ụmụ m, maọbụ hichapụ aha m site nʼezinaụlọ nna m.” Devid ṅụụrụ Sọl iyi. Emesịa, Sọl laghachiri nʼụlọ ya, ma Devid na ndị ikom ya laghachiri nʼọgba nkume ha.

I. SAMUEL 24:1-22 Bible Nso (IGBOB)

O rue, mb͕e Sọl siri n'iso ndi Filistia lata, na egosiri ya, si, Le, Devid nọ n'ọzara En-gedi. Sọl we chiri nnù ndikom asa na ọgu iri arọputara n'Israel nile, ọ je ichọ Devid na ndikom-ya n'elu oké nkume nke ewu-ọhia. Ọ biarue ogige ìgwè ewu na aturu n'uzọ, ọb͕à di kwa n'ebe ahu; Sọl we ba ikpuchi ukwu-ya. Ma Devid na ndikom-ya nānọdu n'akuku ime ọb͕à ahu. Ndikom Devid we si ya, Le, ubọchi nke Jehova siri gi, Le, Mu onwem nēnye onye-iro-gi n'aka-gi, i gēme kwa ya dika o si di nma n'anya-gi. Devid we bilie, were nzuzo bipu ọnu-ọnu uwe-nwuda nke Sọl nwere. O rue, ka emesiri, na obi Devid tara ya uta, n'ihi na o bipuru ọnu-ọnu uwe-nwuda Sọl nwere. Ọ si ndikom-ya, Ya burum ihe-árú site na Jehova; m'gaghi-eme onye-nwem, bú onye Jehova etere manu, ihe a ma-ọli, bú iseti akam megide ya, n'ihi na onye Jehova etere manu ka ọ bu. Devid we were okwu ndia b͕ochie ndikom-ya, o kweghi kwa ka ha bilie imegide Sọl. Sọl we si n'ọb͕à ahu bilie, je ije-ya. Devid we bilie ka emesiri, si n'ọb͕à ahu pua, kpọ òkù n'azu Sọl, si, Onye-nwem eze. Sọl we legide anya n'azu-ya, Devid we rube iru-ya n'ala, kpọ isi ala. Devid we si Sọl, N'ìhi gini ka i nēge nti okwu madu, si, Le, Devid nāchọ imejọ gi? Le, ubọchi ta ka anya-gi abua huworo otú Jehova nyere gi n'akam ta n'ọb͕à: ewe si ka m'b͕ue gi: ma anyam mere gi ebere; m'we si, M'gaghi-eseti akam megide onye-nwem, n'ihi na onye Jehova etere manu ka ọ bu. Ma, nnam, le, e, le ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi n'akam: n'ihi na nime nbipu m'bipuru ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi, ma eb͕ughm i, gi mara hu kwa na ọ dighi ihe ọjọ ma-ọbu njehie di n'akam, emehieghkwam megide gi; ma gi onwe-gi nāchu ntá nkpuru-obim iwere ya. Jehova kpe ikpe n'etiti mu na gi, Jehova bọ-kwa-ram ọ́bọ̀ n'aru gi: ma akam agaghi-adi n'aru gi. Dika ilu ndi mb͕e mbu nāsi, Na ndi nēmebi iwu ka nmebi-iwu si aputa: ma akam agaghi-adi n'aru gi. Ònye ka eze Israel putaworo iso n'azu? ònye ka i nāchu n'azu? ọ bu n'azu nkita nwuru anwu, n'azu otù igwu. Ma Jehova buru onye-ikpe, kpe ikpe n'etiti mu na gi, Ya hu kwa, kpe ọnum n'ikpe, kpeputam n'aka-gi. O rue, mb͕e Devid gwabìri Sọl okwu ndia, na Sọl siri, Ọ̀ bu olu-gi, bú nka, nwam Devid? Sọl we welie olu-ya, kwa ákwá. Ọ si Devid, Onye ezi omume ka i bu karim: n'ihi na gi onwe-gi emewom ezi ihe, ma mu onwem emewo gi ihe ọjọ. Gi onwe-gi egosiwo ta na i mewo ezi ihe n'ebe m'nọ: n'ihi na mb͕e Jehova mechibidorom nye n'aka-gi, i b͕ughm. Ma mb͕e madu gāchọta onye-iro-ya, ò gēzilaga kwa ya n'ezi uzọ? Jehova kwughachi kwa gi ezi ihe n'ọnọdu ihe a i meworom ta. Ma ub͕u a, le, amawom na i ghaghi ibu eze, na agēme kwa ka ala-eze Israel guzosie ike n'aka-gi. Ma ub͕u a were Jehova ṅuaram iyi, na i gaghi-ebipu nkpurum gānọchim n'azu, na i gaghi-ekpochapu aham n'ulo nnam. Devid we ṅuara Sọl iyi. Sọl we laghachi; ma Devid na ndikom-ya rigoro n'ebe ahu ewusiri ike.