I. SAMUEL 23:13-29
I. SAMUEL 23:13-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi ya, Devid na ndị ikom ya ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom isii, hapụrụ Keila pụọ na-awagharị site nʼotu ebe gaa nʼebe ọzọ. Mgbe Sọl nụrụ na Devid esitela na Keila pụọ, o jekwaghị ebe ahụ ọzọ. Nʼoge a, Devid nọgidere nʼebe e wusiri ike dị nʼọzara, na nʼala ugwu ugwu nke ọzara Zif. Ụbọchị niile, Sọl chọgharịrị ya ma Chineke enyefeghị Devid nʼaka ya. Mgbe Devid nọ na Horesh, nke dị nʼọzara Zif, ọ natara ozi na Sọl na-abịa igbu ya. Jonatan, nwa Sọl pụrụ ịchọ Devid. Mgbe ọ hụrụ ya na Horesh, ọ gbara ya ume, nyere ya aka iguzosi ike nʼime Chineke. Jonatan sịrị ya, “Atụla egwu, nna m Sọl apụghị ịchọta gị. Ị ga-abụ eze Izrel. Aga m abụkwa onye na-eso gị dịka Sọl nna m maara nke ọma.” Ha abụọ gbara ndụ nʼihu ONYENWE ANYị. Devid nọgidere na Horesh, ma Jonatan laghachiri nʼụlọ ya. Ma ndị Zif biliri jekwuru Sọl na Gibea sị ya, “Devid o zoghị onwe ya nʼetiti anyị nʼọgba nkume dị nʼọhịa Horesh, nʼugwu Hakila, na ndịda Jeshimọn? Ugbu a, eze anyị, bịa mgbe ọbụla ị chọrọ, ka anyị gaa jidere gị ya. Ị ga-emekwa ya dịka obi gị sị chọọ.” Sọl zara ha sị, “ONYENWE ANYị gọzie unu nʼihi mmetụta ọnọdụ m na-emetụta unu nʼobi. Gaanụ chọpụta nke ọma ebe ọ na-ezo onwe ya, na onye hụrụ ya, nʼihi na agwara m na ọ bụ onye aghụghọ. Chọpụtanụ ebe ọ na-ezo onwe ya ma lọghachikwanụ bịa gwa m ihe unu chọpụtara. Mgbe ahụ, aga m eso unu jee. Ọ bụrụ na ọ nọ nʼala ahụ, aga m achọpụta ya; e, aga m enyobanye anya chọọ ya nʼikwu niile nke Juda.” Ha biliri buru Sọl ụzọ gawa Zif. Nʼoge a, Devid na ndị agha ya nọ nʼọzara Maon, nʼime Araba, na ndịda Jeshimọn. Sọl na ndị agha ya bịarutere ebe ahụ malite chọwa Devid. Mgbe a gwara Devid na Sọl na-achọ ya, o duuru ndị agha ya gbada gaa nʼoke nkume ahụ ma nọgide nʼọzara Maon. Mgbe Sọl nụrụ nke a, ọ chụgidekwara Devid ọsọ gaa nʼebe ahụ. Mgbe ha ruru nʼebe ahụ, Sọl na ndị agha ya nọ nʼotu akụkụ ugwu ahụ, Devid na ndị agha ya nọkwa nʼakụkụ nke ọzọ, na-eme ngwa ka ha gbanarị Sọl. Ma Sọl na ndị agha ya na-abịa nnọọ nso ijide Devid. Ma nʼotu mgbe ahụ, onyeozi bịakwutere Sọl sị ya, “Mee ngwangwa, lọta, nʼihi na ndị Filistia apụtala ibuso Izrel agha.” Ngwangwa, Sọl sitere nʼịchụ Devid chigharịa azụ, lọta ibuso ndị Filistia agha. Site nʼoge ahụ, a kpọrọ ebe ahụ Devid nọ, Sela Hamahlekot, nke pụtara, Nkume Nkewa. Devid si nʼebe ahụ pụọ gaa biri nʼebe e wusiri ike nke En-Gedi, ebe o zoro onwe ya.
I. SAMUEL 23:13-29 Bible Nso (IGBOB)
Devid na ndikom-ya, ihe ra ka nnù ndikom na ọgu iri, we bilie, si na Keila pua, ha we nējeghari ebe ha huru uzọ ijeghari. Ewe gosi Sọl na Devid esiwo na Keila wepuga onwe-ya; o we ghara iputa. Devid we nọdu n'ọzara n'ebe ewusiri ike, o we nọdu n'ugwu n'ọzara Zif. Sọl we nāchọ ya ubọchi nile, ma Chineke enyeghi ya n'aka-ya. Devid we hu na Sọl aputawo ichọ ndu-ya: ma Devid nọ n'ọzara Zif n'oké ọhia. Jonatan nwa Sọl we bilie, jekuru Devid n'oké ọhia ahu, me ka aka-ya di ike nime Chineke. Ọ si ya, Atula egwu: n'ihi na aka nnam, bú Sọl, agaghi-achọta gi; gi onwe-gi gābu kwa eze Israel, mu onwem gābu-kwa-ra gi onye nke-abua; ọzọ kwa, Sọl, bú nnam, mara nka. Ha abua we b͕a ndu n'iru Jehova: Devid we nọdu n'oké ọhia, ma Jonatan lara n'ulo-ya. Ndi Zif we rigokuru Sọl rue Gibea, si, Devid, ò zoghi onwe-ya n'etiti ayi n'ebe ewusiri ike n'oké ọhia, n'ugwu ntà Hakila, nke di na Ndida nke ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu? Ma ub͕u a, eze, dika agu nile nke nāgu nkpuru-obi-gi iridata si di, ridata; ọ diri ayi imechibido ya nye n'aka eze. Sọl we si, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu; n'ihi na unu enwewo ọmiko n'arum. Biko, lanu, dozi-kwa-nu ọzọ, mára hu kwa ọnọdu-ya ebe ukwu-ya di, na onye huworo ya n'ebe ahu: n'ihi na agwawom na ya onwe-ya nāghọ aghughọ nke-uku. Ma hunu, we mara ebe-izo-nzuzo nile ebe o nēzo onwe-ya, unu biaghachikutekwam mb͕e unu dozisiri onwe-unu, m'gēso kwa unu je: o gēru kwa, ọ buru na ọ nọ n'ala nka, na m'gāchọputa ya n'usu nnù ndikom Juda abua na ọgu iri nile. Ha we bilie, jerue Zif n'iru Sọl: ma Devid na ndikom-ya di n'ọzara Maon, n'Araba, na Ndida nke ala ahu tọb͕ọrọ n'efu. Sọl na ndikom-ya we je ichọ ya. Ha we gosi Devid: o we rida rue nkume ahu di elu, nọdu n'ọzara Maon. Sọl we nu ya, chua Devid n'azu n'ọzara Maon. Sọl we je n'otù akuku ugwu, Devid na ndikom-ya n'akuku nke-ọzọ nke ugwu ahu: Devid we zọlie ọsọsọ ib͕apu n'iru Sọl; ma Sọl na ndikom-ya nāb͕a Devid na ndikom-ya buruburu inwude ha. Ma onye-ozi biakutere Sọl, si, Me ngwa, lata; n'ihi na ndi Filistia amadewo imegide ala-ayi. Sọl we si n'ichu Devid n'azu laghachi, je izute ndi Filistia: n'ihi ya ka ha kpọrọ ebe ahu Sela-hamahlekot. Devid we si n'ebe ahu rigo, nọdu n'ebe ewusiri ike nke En-gedi.