I. SAMUEL 23:1-12
I. SAMUEL 23:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu ụbọchị, ozi rutere Devid ntị na ndị Filistia na-ebuso ndị obodo Keila agha na-apụnara ha ihe niile ha nwere nke dị nʼebe ịzọcha ọka ha niile. Devid jụrụ ONYENWE ANYị ase sị, “Ọ bụ m jee buso ndị Filistia a agha?” ONYENWE ANYị zara ya, “Gaa, buso ndị Filistia agha, zọpụta Keila.” Ma ndị agha Devid sịrị ya, “Lee, anyị onwe anyị na-atụ egwu ihe a ga-eme anyị, ọ bụladị nʼime Juda, oleekwanụ otu anyị ga-esi jee buso ndị Filistia niile agha na Keila?” Devid jụrụ ONYENWE ANYị ọzọ, ma ONYENWE ANYị zara ya nke ugboro abụọ sị, “Jee, rịdaruo Keila, nʼihi na aga m anọnyere gị; ị ga-emerikwa ndị Filistia.” Ya mere, Devid na ndị agha ya gara Keila buso ndị Filistia agha. Ndị agha Devid gburu ọtụtụ ndị Filistia kpokọrọ igwe anụ ụlọ ha. Ha zọpụtakwara ndị Keila. (Ugbu a, Abịata nwa Ahimelek chịkwa efọọd nʼaka gbadaa, mgbe ọ gbakwujere Devid na Keila). Mgbe a gwara Sọl na Devid nọ na Keila, o kwuru sị, “Ahaa! Chineke enyefeela ya nʼaka m, nʼihi na Devid e jirila aka ya kee onwe ya agbụ site nʼịbanye nʼobodo nwere ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha.” Sọl chịkọtara ndị agha ya ịga Keila ịnọchibido Devid na ndị ikom ya. Mgbe Devid nụrụ ihe Sọl na-achọ ime, ọ gwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Chịta efọọd ahụ.” Devid sịrị, “O! ONYENWE ANYị, Chineke Izrel, anụla m na Sọl na-achọ ịbịa laa Keila na obodo a nʼiyi nʼihi m nọ nʼebe a. Ndị nwe Keila ha ga-arara m nye nʼaka Sọl? Ọ bụ ezie na Sọl na-abịa dịka m nụrụ? O! ONYENWE ANYị, Chineke Izrel, biko gwa ohu gị.” Ma ONYENWE ANYị sịrị, “Ọ ga-abịa.” Ọzọkwa, Devid jụrụ sị, “Ndị nwe Keila ha ga-arara m na ndị ikom m nye nʼaka Sọl?” ONYENWE ANYị sịrị, “Ha ga-eme otu a.”
I. SAMUEL 23:1-12 Bible Nso (IGBOB)
Ha we gosi Devid, si, Le, ndi Filistia nēbuso Keila agha, ndi ahu nāpunara ha ebe-nzọcha-ọka nile ha. Devid we jua Jehova ase, si, M'gēje tib͕ue ndi Filistia ndia? Jehova we si Devid, Je, tib͕ue ndi Filistia, zọputa Keila. Ndikom Devid we si ya, Le, ayi onwe-ayi nātu egwu n'ebe a nime Juda: àyi gēsi kwa aṅa ghara itu egwu kari mb͕e ayi gēje Keila, rue usoro-agha nile nke ndi Filistia? Devid we ju kwa Jehova ase ọzọ. Jehova we za ya, si, Bilie, rida rue Keila; n'ihi na Mu onwem nēnye ndi Filistia n'aka-gi, Devid na ndikom-ya we jerue Keila, buso ndi Filistia agha, kpuru anu-ulo-ha, tib͕ue ha ntib͕u uku. Devid we zọputa ndi bi na Keila. O rue, mb͕e Abaiata nwa Ahimelek b͕akuru Devid rue Keila, na ọ chiri ephod n'aka-ya rida. Ewe gosi Sọl na Devid abàwo na Keila. Sọl we si, Chineke ajuwo ya, rapu ya n'akam; n'ihi na emechibidowo ya nime, n'ibà n'obodo nwere ibo ọnu-uzọ-ama na nkpọrọ. Sọl we me ka ndi Israel nile nuru na ha gēje agha, iridaru Keila, inọchigide Devid na ndikom-ya n'agha. Devid we mara na ọ bu ya ka Sọl nēcheputa ihe ọjọ megide; o we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, Chita ephod nso. Devid we si, Jehova, bú Chineke Israel, orù-Gi anuwo n'ezie na Sọl nāchọ ibiaru Keila, ibibi obodo a n'ihim. Ndi-nwe Keila, ha gēmechibidom nye n'aka-ya? Sọl, ọ̀ gāridata, dika orù-Gi nuworo? Jehova, bú Chineke Israel, biko, gosi orù-Gi. Jehova we si, Ọ gāridata. Devid we si, Ndi-nwe Keila, hà gēmechibidom na ndikom nkem nye n'aka Sọl? Jehova we si, Ha gēmechibido gi nye.