I. SAMUEL 20:16-18
I. SAMUEL 20:16-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Jonatan na ụlọ Devid gbara ndụ. O kwuru sị, “Ka ONYENWE ANYị kpee ndị iro Devid niile ikpe.” Jonatan mere ka Devid site nʼịhụnanya ọ hụrụ ya ṅụọra ya iyi. Nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka ọ hụrụ onwe ya. Mgbe ahụ, Jonatan sịrị Devid, “Echi bụ mmemme ọnwa ọhụrụ. A ga-ele anya gị, nʼihi na ọnọdụ gị ga-atọgbọrọ nʼefu.
Kesaa
Gụọ I. SAMUEL 20I. SAMUEL 20:16-18 Bible Nso (IGBOB)
Jonatan na ulo Devid we b͕a ndu, si, Jehova gājuta ya n'aka ndi-iro Devid. Jonatan we me kwa ka Devid ṅua iyi ọzọ, n'ihi na ọ huru ya n'anya: n'ihi na dika ọ huru nkpuru-obi nke onwe-ya n'anya, otú a ka ọ huru Devid n'anya. Jonatan we si ya, Echi ka ọnwa ọhu gāpu: agēle kwa anya gi, n'ihi na agēle anya ọnọdu-gi nke tọb͕ọrọ n'efu.
Kesaa
Gụọ I. SAMUEL 20