I. SAMUEL 20:1-17
I. SAMUEL 20:1-17 Bible Nso (IGBOB)
Devid we si na Naiot nime Rema b͕alaga, ọ bia kwue n'iru Jonatan, si, Gini ka m'meworo? gini bu ajọ omumem? gini bu kwa nmehiem n'iru nna-gi, na ọ nāchọ ndum? Ọ si ya, Ya buru ihe-árú; i gaghi-anwu: le, nnam adighi-eme ihe uku ma-ọbu ihe ntà, ma ọ buru na o kpughepughi ntim ka m'nu ya: gini me-kwa-ra nnam ji zonarim ihe a? ọ bughi otú a. Devid we ṅua iyi ọzọ, si, Nna-gi amawo nke-ọma na ahutawom amara n'iru gi; o we si, Ka Jonatan ghara ima nka, ka o we ghara iwuta ya: ma otú ọ di, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, nání ihe ra ka otù nzọ-ukwu di n'ab͕ata mu na ọnwu. Jonatan we si Devid, Gini ka nkpuru-obi-gi nāsi? m'gēme-kwa-ra gi ya. Devid we si Jonatan, Le, ọnwa ọhu gāpu echi, mu onwem aghaghi kwa iso eze nọdu n'iri ihe: ma zilagam, ka m'we zo onwem n'ọhia rue anyasi nwa-nne-echi. Ọ buru na nna-gi ele anyam ma-ọli, i gāsi kwa, Devid riọsirim ike ka m'rapu ya ka ọ b͕a ọsọ je Bet-lehem, bú obodo-ya: n'ihi na àjà arọ diri ab͕uru-ya nile n'ebe ahu. Ọ buru na ọ si otú a, Ọ di nma; udo gādiri orù-gi: ma ọ buru na iwe-ya di ọku nke-uku, mara na o zubesiri ihe ọjọ a ike. Ma i gēmere orù-gi ebere; n'ihi na i mere ka orù-gi soro gi ba n'ọb͕ub͕a-ndu Jehova: ma ọ buru na ajọ omume di nimem, gi onwe-gi me ka m'nwua; ma n'ìhi gini kwa ka i gēme ka m'bakuru nna-gi? Jonatan we si, Ya buru gi ihe-árú: n'ihi na ọ buru na amaram n'ezie na nnam zubesiri ike ka ihe ọjọ a biakwasi gi, #m'gaghi-egosi kwa gi ya? Devid we si Jonatan, Ònye gēgosim? ma-ọbu gini gēme ma ọ buru na nna-gi aza gi okwu ike? Jonatan we si Devid, Bia, ka ayi pua je n'ọhia. Ha abua we pua je n'ọhia. Jonatan we si Devid, Jehova, bú Chineke Israel, Ya buru onye-àmà; mb͕e m'gēnyochata obi nnam dika mb͕e a echi, ma-ọbu nwa-nne-echi, ma, le, ọ di nma n'ebe Devid nọ, #m'gaghi-ezite-kwa-ra gi ozi, we kpughepu nti-gi ka i nu ya? Jehova me Jonatan otú a, me kwa ya ihe ọzọ otú a, mb͕e ọ di nnam nma ime gi ihe ọjọ a, ma m'kpughepughi nti-gi ka i nu ya, we zilaga gi, ka i we la n'udo: Jehova nọye-kwa-ra gi, dika Ọ nọyeworo nnam. Ma ọ bughi nání mb͕e m'nọ na ndu ka i gēmerem ebere nke Jehova, ka m'we ghara inwu: kama i gaghi-ebipu kwa ebere-gi n'ulom rue mb͕e ebighi-ebi: i gaghi-ebipu kwa ya mb͕e Jehova bipuworo ndi-iro Devid, nwoke ọ bula n'elu uwa. Jonatan na ulo Devid we b͕a ndu, si, Jehova gājuta ya n'aka ndi-iro Devid. Jonatan we me kwa ka Devid ṅua iyi ọzọ, n'ihi na ọ huru ya n'anya: n'ihi na dika ọ huru nkpuru-obi nke onwe-ya n'anya, otú a ka ọ huru Devid n'anya.
I. SAMUEL 20:1-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Devid sitere na Naịọt nʼime Rema gbapụ ọsọ, chọta Jonatan, sị ya, “Ọ bụ gịnị ka m mere? Gịnị bụkwa ihe ọjọọ m mere? Olee ụzọ m si mejọọ nna gị, mere o ji na-achọsi ike ka ọ napụ m ndụ m?” Jonatan sịrị ya, “Nke a abụghị eziokwu. Ị gaghị anwụ! Ihe dị otu a adịghị nna m nʼobi, nʼihi na ọ na-agwa m ihe ọbụla ọ na-ezube ime, ọ bụladị ihe ukwu maọbụ ihe ntakịrị. Amakwaara m na ọ gaghị ezonarị m ihe dị otu a. Mba, ọ bụghị eziokwu.” Devid ṅụrụ iyi sị, “Nna gị maara nke ọma na m anatala amara nʼebe ị nọ, nʼihi ya, o kwuola nʼime onwe ya sị, ‘Agaghị m agwa Jonatan, ka ọ ghara iwute ya.’ Ma eji m ONYENWE ANYị na mkpụrụobi gị na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụ naanị otu nzọ ụkwụ dị ugbu a nʼetiti mụ na ọnwụ.” Jonatan sịrị Devid, “Ihe ọbụla ị chọrọ ka m mee, aga m emere gị ya.” Devid sịrị ya, “Lee echi ga-abụ mmemme ọnwa ọhụrụ, e kwesiri m iso eze rie nri. Ma hapụ m ka m ga zoo onwe m nʼọhịa tutu ruo uhuruchi nke nwanne echi. Ọ bụrụ na nna gị ajụọ ase m, sị ya, ‘Devid rịọsiri m arịrịọ ike ka m hapụ ya ka ọ gbaga Betlehem, bụ obodo ya, nʼihi a na-achụ aja nke dịrị agbụrụ ya kwa afọ.’ Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ọ dị mma,’ mgbe ahụ, udo ga-adịrị ohu gị. Ma ọ bụrụ na o wee iwe nke ukwuu, mara nʼezie na o zubere ime m ihe ọjọọ. Ma gị onwe gị, meere ohu gị ebere, nʼihi na i meela ka o sooro gị baa nʼọgbụgba ndụ nʼihu ONYENWE ANYị. Ọ bụrụ na ikpe mara m, gị onwe gị gbuo m. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji nyefee m nʼaka nna gị?” Jonatan sịrị, “Agaghị m eme ya, lee, a sịkwa na m maara na nna m na-achọ igbu gị, ọ bụ na m agaghị agwa gị?” Devid jụrụ ya, “Onye ga-agwa m ma ọ bụrụ na nna gị aza gị okwu ike ike?” Jonatan sịrị ya, “Bịa ka anyị pụọ gaa nʼọhịa.” Ya mere, ha abụọ pụrụ jee nʼọhịa. Jonatan gwara Devid sị, “Eji m aha ONYENWE ANYị, Chineke Izrel na-ekwe nkwa na-asị gị, nʼoge ugbu a echi, maọbụ nwanne echi, aga m akpanyere nna m ụka banyere gị, meekwa ka ị mata ihe ọ na-eche banyere gị. Ọ bụrụ na obi dị ya mma nʼebe ị nọ, aga m eme ka ị mata. Ma ọ bụrụ na nna m na-achọ imerụ gị ahụ, ka ONYENWE ANYị mesoo Jonatan mmeso, otu ọbụla o si dị njọ, ma ọ bụrụ na m abịaghị gwa gị, zilaga gị ka ị laa nʼudo. Ka ONYENWE ANYị nọnyere gị dịka o si nọnyere nna m. Chetakwa, i ghaghị igosi m ịhụnanya na obi ebere ONYENWE ANYị, ma ọ bụrụ na m anwụọ. E wezugakwala ịhụnanya gị na obi ebere gị site nʼebe ezinaụlọ m dị, ọ bụladị mgbe ONYENWE ANYị bipụchara ndị iro Devid niile site nʼelu ụwa.” Jonatan na ụlọ Devid gbara ndụ. O kwuru sị, “Ka ONYENWE ANYị kpee ndị iro Devid niile ikpe.” Jonatan mere ka Devid site nʼịhụnanya ọ hụrụ ya ṅụọra ya iyi. Nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka ọ hụrụ onwe ya.