I. SAMUEL 19:4-6
I. SAMUEL 19:4-6 Bible Nso (IGBOB)
Jonatan we gwa Sọl nna-ya okwu di nma bayere Devid, si ya, Ka eze ghara imehie megide orù-ya, bú Devid; n'ihi na o mehieghi megide gi, na n'ihi na omume-ya nile adiwo nma nke-uku n'ebe i nọ: n'ihi na o tiyere ndu-ya n'ọbu-aka-ya, tib͕ue onye Filistia ahu, Jehova we zọputa nzọputa uku bayere Israel nile: i huru ya anya, we ṅuria ọṅu: n'ìhi gini kwa ka i gēmehie megide ọbara nēmeghi ihe ọjọ, ime ka Devid nwua n'efu? Sọl we ge nti olu Jonatan: Sọl we ṅua iyi, si, Jehova nādi ndu, agaghi-eme ka ọ nwua ma-ọli.
I. SAMUEL 19:4-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Jonatan kwuru okwu ọma banyere Devid nye Sọl nna ya sị ya, “Ka eze ghara ime ihe ọjọọ megide Devid bụ ohu ya. O nwebeghị ihe ọjọọ o mere gị. Nʼezie, ihe niile o mere bụ ihe baara gị uru nke ukwuu. Ọ kpọrọ ndụ ya asị mgbe o gburu onye Filistia ahụ. ONYENWE ANYị nyekwara ndị Izrel niile mmeri dị ukwuu. Obi dịkwa gị ụtọ mgbe ị hụrụ nke a. Gịnị mekwaranụ i ga-eji mejọọ nwoke aka ya dị ọcha dịka Devid, site nʼigbu ya ebe ọ bụ na ikpe amaghị ya?” Sọl ṅara Jonatan ntị ṅụọkwa iyi sị, “Dịka ONYENWE ANYị na-adị ndụ, agaghị egbu ya.”