I. SAMUEL 19:18-24
I. SAMUEL 19:18-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Devid gbara ọsọ gbalaga, ọ gakwuru Samuel na Rema, kọrọ ya ihe niile Sọl mere ya. Ya na Samuel gara biri na Naịọt. Ozi ruru Sọl ntị, “Devid nọ na Naịọt nʼime Rema,” ya mere, o zipụrụ ndị ikom ka ha gaa jide ya. Ma mgbe ha rutere, ha hụrụ otu ndị amụma ka ha na-ebu amụma, hụkwa Samuel ka ọ na-eguzo nʼebe ahụ dịka onyeisi ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ndị ozi Sọl ahụ, mee ka ha malitekwa ibu amụma. Mgbe Sọl nụrụ ihe mere, o zipụkwara ndị agha ọzọ, ma ha onwe ha bukwara amụma! Otu ihe ahụ mekwara ndị o zipụrụ nke ugboro atọ. Nʼikpeazụ ya onwe ya pụrụ gaa Rema, ruo nʼolulu mmiri Seku. Ọ jụrụ, “Ebee ka Samuel na Devid nọ?” Ha sịrị, “Ha nọ na Naịọt nke Rema.” Ya mere, Sọl gara Naịọt nke dị na Rema. Ma Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya, dịka ọ na-aga nʼụzọ ọ malitere ibu amụma tutu ruo mgbe ọ bịaruru Naịọt. O yipụrụ uwe ya buo amụma nʼihu Samuel. Ọ gba ọtọ dinara ala nʼebe ahụ ehihie ahụ, na abalị ahụ niile. Ọ bụ nke a mere ndị mmadụ ji sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”
I. SAMUEL 19:18-24 Bible Nso (IGBOB)
Ma Devid b͕alagara, wepuga onwe-ya, biakute Samuel rue Rema, gosi ya ihe nile Sọl mere ya. Ọ we je, ya onwe-ya na Samuel, ha we biri na Naiot. Ewe gosi Sọl, si, Le, Devid nọ na Naiot nime Rema. Sọl we ziga ndi-ozi iwere Devid: ha we hu nzukọ ndi-amuma ahu ka ha nēbu amuma, ha hu kwa Samuel ka ọ nēguzo, dika onye-isi-ha: Mọ nke Chineke we dikwasi ndi-ozi Sọl, ha onwe-ha we bū kwa amuma. Ha we gosi Sọl, o we ziga ndi-ozi ọzọ, ha onwe-ha we bū kwa amuma. Sọl we ziga kwa ndi-ozi ọzọ nke ub͕ò atọ, ha onwe-ha we bū kwa amuma. Ya onwe-ya we je kwa Rema, biarue olùlù-miri uku nke di na Seku: ọ jua, si, Òle ebe Samuel na Devid nọ? Otù onye we si, Le, ha nọ na Naiot nime Rema. O we je n'ebe ahu, rue Naiot nime Rema: Mọ nke Chineke we dikwasi kwa ya, o we nēje, we bue amuma, rue mb͕e ọ batara Naiot nime Rema. Ya onwe-ya we yipu kwa uwe-ya nile, ya onwe-ya we bū kwa amuma n'iru Samuel, da n'ala b͕ara ọtọ ubọchi ahu nile na abali-ya nile. N'ihi ya ka ha nāsi, Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma?