I. SAMUEL 17:45-47
I. SAMUEL 17:45-47 Bible Nso (IGBOB)
Devid we si onye Filistia ahu, Gi onwe-gi nēwere mma-agha, were kwa ube, were kwa nkpunkpu ube, biakutem: ma mu onwem nēwere aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha biakute gi, bú Chineke nke usoro-agha nile nke Israel, Onye i taworo uta. Ubọchi ta ka Jehova gēmechibido gi nye n'akam; m'gētib͕u kwa gi, wezuga isi-gi n'aru gi; m'gēwere kwa ozu ndi ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia nye anu-ufe nke elu-igwe, nye kwa anu-ọhia nke uwa ta; ka uwa nile we mara na Chineke diri Israel: ya na ka nkpọkọta nka nile we mara na ọ bughi mma-agha na ube ka Jehova ji azọputa: n'ihi na Jehova nwe agha nka, Ọ gēnye kwa unu n'aka-ayi.
I. SAMUEL 17:45-47 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma Devid sịrị onye Filistia ahụ, “I ji mma agha na ùbe igwe na ùbe osisi, na-abịakwute m, ma eji m aha ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke usuu ndị agha Izrel ahụ ị kparịrị, na-abịakwute gị. Taa ka ONYENWE ANYị ga-enyefe gị nʼaka m. Aga m etigbu gị, bepụkwa gị isi. Taa aga m ewere anụ ahụ ndị agha Filistia niile nyefee nʼaka ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe, na ụmụ anụ ọhịa niile nke ụwa. Ụwa niile ga-amatakwa na Chineke nọ nʼIzrel. Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na ONYENWE ANYị adịghị eji mma agha maọbụ ùbe azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke ONYENWE ANYị, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.”