I. SAMUEL 17:41-47
I. SAMUEL 17:41-47 Bible Nso (IGBOB)
Onye Filistia ahu we bia, ọ nābia nēru kwa nso Devid; nwoke ahu nke nēbu ọta-ya nēje kwa n'iru ya. Onye Filistia ahu we legide anya buruburu, hu Devid, we lelìa ya anya: n'ihi na ọ bu nwata, nācha kwa ọbara-ọbara, ma kwa nma ile anya. Onye Filistia ahu we si Devid, Ọ̀ bu nkita ka m'bu, na gi onwe-gi nēwere nkpa-n'aka biakutem? Onye Filistia ahu we were chi-ya nile kọcha Devid. Onye Filistia ahu we si Devid, Biakutem, ka m'were kwa anu-aru-gi nye anu-ufe nke elu-igwe na anumanu nke ọhia. Devid we si onye Filistia ahu, Gi onwe-gi nēwere mma-agha, were kwa ube, were kwa nkpunkpu ube, biakutem: ma mu onwem nēwere aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha biakute gi, bú Chineke nke usoro-agha nile nke Israel, Onye i taworo uta. Ubọchi ta ka Jehova gēmechibido gi nye n'akam; m'gētib͕u kwa gi, wezuga isi-gi n'aru gi; m'gēwere kwa ozu ndi ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia nye anu-ufe nke elu-igwe, nye kwa anu-ọhia nke uwa ta; ka uwa nile we mara na Chineke diri Israel: ya na ka nkpọkọta nka nile we mara na ọ bughi mma-agha na ube ka Jehova ji azọputa: n'ihi na Jehova nwe agha nka, Ọ gēnye kwa unu n'aka-ayi.
I. SAMUEL 17:41-47 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye Filistia ahụ, na-abịa nso na-apụkwute Devid, onye ahụ na-ebu ọta ya na-agakwa nʼihu ya. O lere Devid anya hụ na ọ bụ naanị nwantakịrị nwoke, onye ahụ dị mma, onye mara mma ile anya. Nʼihi ya, o ledara Devid anya. Ọ sịrị Devid, “Abụ m nkịta, na i ji mkpanaka na-abịakwute m?” Onye Filistia ahụ ji aha chi niile ya bụọ Devid ọnụ. Ọ sịrị, “Bịa nʼebe a ka m were anụ ahụ gị mere anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa niile ihe oriri!” Ma Devid sịrị onye Filistia ahụ, “I ji mma agha na ùbe igwe na ùbe osisi, na-abịakwute m, ma eji m aha ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke usuu ndị agha Izrel ahụ ị kparịrị, na-abịakwute gị. Taa ka ONYENWE ANYị ga-enyefe gị nʼaka m. Aga m etigbu gị, bepụkwa gị isi. Taa aga m ewere anụ ahụ ndị agha Filistia niile nyefee nʼaka ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe, na ụmụ anụ ọhịa niile nke ụwa. Ụwa niile ga-amatakwa na Chineke nọ nʼIzrel. Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na ONYENWE ANYị adịghị eji mma agha maọbụ ùbe azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke ONYENWE ANYị, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.”