I. SAMUEL 17:34-37
I. SAMUEL 17:34-37 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma Devid gwara Sọl sị, “Ohu gị bụ onye na-elekọta atụrụ nna ya. Mgbe ọdụm maọbụ anụ ọhịa bịa bịara buru atụrụ site nʼigwe atụrụ ahụ, achụụrụ m ya, tigbuo ya ma napụtakwa atụrụ ahụ site nʼọnụ ya. Mgbe o biliri imegide m, ejidere m ya nʼajị ya, tie ya ihe, gbuo ya. Etigburu m ọdụm na anụ ọhịa bịa ahụ, ugbu a, apụkwara m ime onye Filistia a na-amaghị Chineke otu ihe ahụ, nʼihi na ọ kparịala usuu ndị agha Chineke dị ndụ! ONYENWE ANYị ahụ napụtara m site nʼaka ọdụm na anụ ọhịa bịa ga-anapụtakwa m site nʼaka onye Filistia a!” Nʼikpeazụ, Sọl sịrị Devid, “Gaa, ka ONYENWE ANYị nọnyere gị.”
I. SAMUEL 17:34-37 Bible Nso (IGBOB)
Devid we si Sọl, Onye nāzùru nna-ya ìgwè ewu na aturu ka orù-gi buworo; ọdum we bia, ya na bear, we būpu nwa-aturu n'ìgwè aturu, m'we pua so ya n'azu, tib͕ue ya, naputa nwa-aturu ahu n'ọnu-ya: o we bilie imegidem, m'we jide ya n'ọza-ya, tib͕ue ya, me ka ọ nwua. Orù-gi tib͕uru ma ọdum ahu ma bear ahu: onye Filistia nka anēbìghi úgwù gādi kwa ka otù nime ha, n'ihi na ọ bu usoro-agha nile nke Chineke di ndu ka ọ taworo uta. Devid we si, Jehova nke naputaram n'aka ọdum, na n'aka bear, Ya onwe-ya gānaputam n'aka onye Filistia nka. Sọl we si Devid, Je, Jehova gānọye-kwa-ra gi.