I. SAMUEL 17:33-38
I. SAMUEL 17:33-38 Bible Nso (IGBOB)
Sọl we si Devid, I pughi ijekuru onye Filistia nka iluso ya ọ̀gù: n'ihi na nwata ka i bu, ma ya onwe-ya bu nwoke agha site na mb͕e ọ di na nwata. Devid we si Sọl, Onye nāzùru nna-ya ìgwè ewu na aturu ka orù-gi buworo; ọdum we bia, ya na bear, we būpu nwa-aturu n'ìgwè aturu, m'we pua so ya n'azu, tib͕ue ya, naputa nwa-aturu ahu n'ọnu-ya: o we bilie imegidem, m'we jide ya n'ọza-ya, tib͕ue ya, me ka ọ nwua. Orù-gi tib͕uru ma ọdum ahu ma bear ahu: onye Filistia nka anēbìghi úgwù gādi kwa ka otù nime ha, n'ihi na ọ bu usoro-agha nile nke Chineke di ndu ka ọ taworo uta. Devid we si, Jehova nke naputaram n'aka ọdum, na n'aka bear, Ya onwe-ya gānaputam n'aka onye Filistia nka. Sọl we si Devid, Je, Jehova gānọye-kwa-ra gi. Sọl we yikwasi Devid uwe-nwuda-ya, kpukwasi okpu-agha ọla n'isi-ya, yikwasi ya uwe-agha.
I. SAMUEL 17:33-38 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma Sọl zaghachiri, “Ị pụghị ibuso onye Filistia a agha, megide ya, nʼihi na i bụ naanị nwantakịrị, ma ya onwe ya bu onye na-ebu agha siterị na mgbe ọ bụ okorobịa.” Ma Devid gwara Sọl sị, “Ohu gị bụ onye na-elekọta atụrụ nna ya. Mgbe ọdụm maọbụ anụ ọhịa bịa bịara buru atụrụ site nʼigwe atụrụ ahụ, achụụrụ m ya, tigbuo ya ma napụtakwa atụrụ ahụ site nʼọnụ ya. Mgbe o biliri imegide m, ejidere m ya nʼajị ya, tie ya ihe, gbuo ya. Etigburu m ọdụm na anụ ọhịa bịa ahụ, ugbu a, apụkwara m ime onye Filistia a na-amaghị Chineke otu ihe ahụ, nʼihi na ọ kparịala usuu ndị agha Chineke dị ndụ! ONYENWE ANYị ahụ napụtara m site nʼaka ọdụm na anụ ọhịa bịa ga-anapụtakwa m site nʼaka onye Filistia a!” Nʼikpeazụ, Sọl sịrị Devid, “Gaa, ka ONYENWE ANYị nọnyere gị.” Mgbe ahụ, Sọl yinyere Devid uwe ime ahụ nke ya, yikwasịkwa ya uwe agha igwe, ma kpukwasị ya okpu bronz nʼisi.