Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 17:32-51

I. SAMUEL 17:32-51 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Devid sịrị Sọl, “Ka obi onye ọbụla ghara ịda mba nʼihi onye Filistia a; ohu gị ga-aga lụso ya ọgụ.” Ma Sọl zaghachiri, “Ị pụghị ibuso onye Filistia a agha, megide ya, nʼihi na i bụ naanị nwantakịrị, ma ya onwe ya bu onye na-ebu agha siterị na mgbe ọ bụ okorobịa.” Ma Devid gwara Sọl sị, “Ohu gị bụ onye na-elekọta atụrụ nna ya. Mgbe ọdụm maọbụ anụ ọhịa bịa bịara buru atụrụ site nʼigwe atụrụ ahụ, achụụrụ m ya, tigbuo ya ma napụtakwa atụrụ ahụ site nʼọnụ ya. Mgbe o biliri imegide m, ejidere m ya nʼajị ya, tie ya ihe, gbuo ya. Etigburu m ọdụm na anụ ọhịa bịa ahụ, ugbu a, apụkwara m ime onye Filistia a na-amaghị Chineke otu ihe ahụ, nʼihi na ọ kparịala usuu ndị agha Chineke dị ndụ! ONYENWE ANYị ahụ napụtara m site nʼaka ọdụm na anụ ọhịa bịa ga-anapụtakwa m site nʼaka onye Filistia a!” Nʼikpeazụ, Sọl sịrị Devid, “Gaa, ka ONYENWE ANYị nọnyere gị.” Mgbe ahụ, Sọl yinyere Devid uwe ime ahụ nke ya, yikwasịkwa ya uwe agha igwe, ma kpukwasị ya okpu bronz nʼisi. Devid fanyere mma agha nʼime uwe ahụ, malite ijegharị ije, nʼihi na ọ maghị otu e si eyi uwe ndị ahụ ejegharị. Ọ dịghị anya, o gwara Sọl okwu sị, “Agaghị m eyi uwe ndị a nʼihi na o doghị m ahụ.” Ya mere, Devid yipụrụ ha. Emesịa, o were mkpanaka ya nʼaka ya, site nʼiyi họpụta nkume ise dị mụrụmụrụ tinye ha nʼakpa nta dị nʼime akpa onye ọzụzụ atụrụ ya. O jidere ebe ya nʼaka ya, malite ịpụkwuru onye Filistia ahụ. Onye Filistia ahụ, na-abịa nso na-apụkwute Devid, onye ahụ na-ebu ọta ya na-agakwa nʼihu ya. O lere Devid anya hụ na ọ bụ naanị nwantakịrị nwoke, onye ahụ dị mma, onye mara mma ile anya. Nʼihi ya, o ledara Devid anya. Ọ sịrị Devid, “Abụ m nkịta, na i ji mkpanaka na-abịakwute m?” Onye Filistia ahụ ji aha chi niile ya bụọ Devid ọnụ. Ọ sịrị, “Bịa nʼebe a ka m were anụ ahụ gị mere anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa niile ihe oriri!” Ma Devid sịrị onye Filistia ahụ, “I ji mma agha na ùbe igwe na ùbe osisi, na-abịakwute m, ma eji m aha ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke usuu ndị agha Izrel ahụ ị kparịrị, na-abịakwute gị. Taa ka ONYENWE ANYị ga-enyefe gị nʼaka m. Aga m etigbu gị, bepụkwa gị isi. Taa aga m ewere anụ ahụ ndị agha Filistia niile nyefee nʼaka ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe, na ụmụ anụ ọhịa niile nke ụwa. Ụwa niile ga-amatakwa na Chineke nọ nʼIzrel. Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na ONYENWE ANYị adịghị eji mma agha maọbụ ùbe azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke ONYENWE ANYị, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.” Mgbe onye Filistia ahụ na-abịa nso ibuso ya agha, Devid jiri ọsọ gbara gaa nʼihu agha izute ya. Ọ manyere aka nʼime akpa ya wepụta otu nkume, maa ya mata onye Filistia ahụ nʼegedege ihu. Nkume ahụ mikpuru nʼegedege ihu ya, ọ dakwara kpuo ihu nʼala. Otu a ka Devid si jiri ebe na nkume merie onye Filistia ahụ. O gburu onye Filistia ahụ ma o jighị mma ọbụla nʼaka ya gbuo ya. Devid gbaara ọsọ jeruo nʼebe Golaịat dara, mịịrị mma agha ya site nʼọbọ, jiri ya gbuo ya. O ji ya bepụkwa isi ya! Mgbe ndị Filistia hụrụ na onye ọka agha ha adaala nwụọ, ha tụgharịrị gbawa ọsọ.

I. SAMUEL 17:32-51 Bible Nso (IGBOB)

Devid we si Sọl, Ka obi madu ọ bula ghara ifepu n'ihi ya; orù-gi gēje luso onye Filistia nka ọ̀gù. Sọl we si Devid, I pughi ijekuru onye Filistia nka iluso ya ọ̀gù: n'ihi na nwata ka i bu, ma ya onwe-ya bu nwoke agha site na mb͕e ọ di na nwata. Devid we si Sọl, Onye nāzùru nna-ya ìgwè ewu na aturu ka orù-gi buworo; ọdum we bia, ya na bear, we būpu nwa-aturu n'ìgwè aturu, m'we pua so ya n'azu, tib͕ue ya, naputa nwa-aturu ahu n'ọnu-ya: o we bilie imegidem, m'we jide ya n'ọza-ya, tib͕ue ya, me ka ọ nwua. Orù-gi tib͕uru ma ọdum ahu ma bear ahu: onye Filistia nka anēbìghi úgwù gādi kwa ka otù nime ha, n'ihi na ọ bu usoro-agha nile nke Chineke di ndu ka ọ taworo uta. Devid we si, Jehova nke naputaram n'aka ọdum, na n'aka bear, Ya onwe-ya gānaputam n'aka onye Filistia nka. Sọl we si Devid, Je, Jehova gānọye-kwa-ra gi. Sọl we yikwasi Devid uwe-nwuda-ya, kpukwasi okpu-agha ọla n'isi-ya, yikwasi ya uwe-agha. Devid we kekwasi mma-agha-ya n'uwe-nwuda-ya, we jisie ike ije; n'ihi na ọ nwaghi ya. Devid we si Sọl, Apughm iwere ihe ndia je; n'ihi na anwaghm ha. Devid we yipu ha n'aru ya. O were nkpa-n'aka-ya n'aka-ya, rọputara onwe-ya nkume ise kwọrọ murumuru na miri-iyi, tiye ha n'ihe ndi-ọzùzù-aturu nke o nwere, bú n'àkpà-ya; èbè-ya di kwa n'aka-ya: o we biarue nso onye Filistia ahu. Onye Filistia ahu we bia, ọ nābia nēru kwa nso Devid; nwoke ahu nke nēbu ọta-ya nēje kwa n'iru ya. Onye Filistia ahu we legide anya buruburu, hu Devid, we lelìa ya anya: n'ihi na ọ bu nwata, nācha kwa ọbara-ọbara, ma kwa nma ile anya. Onye Filistia ahu we si Devid, Ọ̀ bu nkita ka m'bu, na gi onwe-gi nēwere nkpa-n'aka biakutem? Onye Filistia ahu we were chi-ya nile kọcha Devid. Onye Filistia ahu we si Devid, Biakutem, ka m'were kwa anu-aru-gi nye anu-ufe nke elu-igwe na anumanu nke ọhia. Devid we si onye Filistia ahu, Gi onwe-gi nēwere mma-agha, were kwa ube, were kwa nkpunkpu ube, biakutem: ma mu onwem nēwere aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha biakute gi, bú Chineke nke usoro-agha nile nke Israel, Onye i taworo uta. Ubọchi ta ka Jehova gēmechibido gi nye n'akam; m'gētib͕u kwa gi, wezuga isi-gi n'aru gi; m'gēwere kwa ozu ndi ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia nye anu-ufe nke elu-igwe, nye kwa anu-ọhia nke uwa ta; ka uwa nile we mara na Chineke diri Israel: ya na ka nkpọkọta nka nile we mara na ọ bughi mma-agha na ube ka Jehova ji azọputa: n'ihi na Jehova nwe agha nka, Ọ gēnye kwa unu n'aka-ayi. O rue, mb͕e onye Filistia ahu biliri, bia rue nso izute Devid, na Devid mere ngwa, b͕a ọsọ ijekuru usoro-agha izute onye Filistia ahu. Devid we setia aka-ya tiye n'àkpà-ya, weputa otù nkume nime ya, ma ya, mata onye Filistia ahu n'egedege-iru-ya; nkume ahu we bamìe n'egedege-iru-ya, o we da kpue iru-ya n'ala. Devid we were èbè, were kwa nkume, kwa onye Filistia n'ike, o we tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua; ma mma-agha adighi n'aka Devid. Devid we b͕a ọsọ, guzo n'elu onye Filistia ahu, were mma-agha-ya, miputa ya n'ọbọ-ya, me ka ọ nwua, ọ were ya bipu isi-ya. Ndi Filistia we hu na dike-ha anwuwo, ha we b͕alaga.