I. SAMUEL 14:24-52
I. SAMUEL 14:24-52 Bible Nso (IGBOB)
Ma achiri ndikom Israel n'ihe-ike ubọchi ahu: Sọl we b͕a ndi Israel iyi, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēri nri rue anyasi, ru kwa mb͕e m'bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-irom. Ndi Israel nile we ghara idetu nri ọnu. Ndi ala ahu nile we ba n'oké ọhia; ma manu-aṅu di n'elu ọhia. Ndi Israel we ba n'oké ọhia ahu, ma, le, manu-aṅu nērù erù: ma ọ dighi onye kwere ka aka-ya rue ọnu-ya; n'ihi na ndi Israel turu egwu ọb͕ub͕a-iyi ahu. Ma Jonatan anughi mb͕e nna-ya b͕ara ndi Israel iyi: o we setipu ọnu-ọnu nkpa-n'aka nke di n'aka-ya, rutu ya nime ub͕ub͕ọ-manu-aṅu, weghachi aka-ya n'ọnu-ya; anya-ya we nwue enwu. Otù nwoke n'etiti ndi Israel we za, si, Nna-gi b͕asiri ndi Israel iyi ike, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēri nri ta. Ndi Israel we nāda #mbà. Jonatan we si, Nnam emekpawo ala-ayi aru: biko, lenu na anyam enwuwo enwu, n'ihi na edetuwom nwantī manu-aṅu nka ire. Ànya ndi Israel gēsi aṅa ghara inwukari enwu nke-uku, ma ọ buru na ha rijuru afọ ta site n'ihe-nkwata ndi-iro-ha nke ha hutara? n'ihi na ub͕u a ntib͕u n'etiti ndi Filistia abaghi uba. Ha we tib͕ue ufọdu nime ndi Filistia n'ubọchi ahu site na Mikmash rue Ajalon: ndi Israel we da #mbà nke-uku. Ndi Israel we dakwasi ihe akwatara n'agha, ha we chiri ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na umu-ehi, b͕ue ha n'ala ahu: ndi Israel we rie ha na ọbara. Ha we gosi Sọl, si, Le, ndi Israel nēmehie megide Jehova n'iri anu, ya na ọbara. O we si, Unu aghọwo aghughọ: kpọrekutem nkume uku ta. Sọl we si, B͕asanu onwe-unu n'etiti ndi Israel, si ha, Wetaranum nso, nwoke ọ bula ehi-ya, na nwoke ọ bula aturu-ya, b͕u-kwa-nu ha n'ebe a, rie; unu emehie-kwa-la megide Jehova n'iri anu. ya na ọbara. Ndi Israel nile we weta nso, nwoke ọ bula ehi-ya n'aka-ya n'abali ahu, ha we b͕ue ha n'ebe ahu. Sọl we wuere Jehova ebe-ichu-àjà: nke ahu ka ọ malitere iwu ka ọ buru ebe-ichu-àjà diri Jehova. Sọl we si, Ka ayi rida sochie ndi Filistia n'azu n'abali, luta ihe-ha n'agha rue ìhè ututu, ka ayi ghara kwa ikwe ka nwoke fọdu n'etiti ha. Ha we si, Me ihe ọ bula nke di nma n'anya-gi. Onye-nchu-àjà we si, Ka ayi biarue Chineke nso n'ebe a. Sọl we jua Jehova ase, si, M'gārida sochie ndi Filistia n'azu? Ì gēnye ha n'aka Israel? Ma Ọ zaghi ya n'ubọchi ahu. Sọl we si, Biaruenu nso n'ebe a, unu ndi-isi nile nke ndi Israel: mara-kwa-nu hu ihe nke nmehie a diworo nime ya ta. N'ihi na Jehova nādi ndu, Onye nāzọputa Israel; n'ezie ọ buru na ọ di nime Jonatan nwam, n'ezie ọ ghaghi inwu. Ma ọ dighi onye nāza ya okwu n'etiti ndi Israel nile. O we si Israel nile, Unu onwe-unu nọ n'otù ofè, mu onwem na Jonatan nwam gānọ kwa n'ofè nke-ọzọ. Ndi Israel we si Sọl, Me ihe nke di nma n'anya-gi. Sọl we si Jehova, bú Chineke Israel, Nye nzà zuru okè. Nzà we ma Jonatan na Sọl: ma ndi Israel puru ya. Sọl we si, Fenu nzà n'etiti mu na Jonatan nwam. Nzà we ma Jonatan. Sọl we si Jonatan, Gosim ihe i meworo. Jonatan we gosi ya, si, N'ezie ewerem ọnu-ọnu nkpa-n'aka nke di n'akam detu nwantī manu-aṅu ire; lem, m'gānwu. Sọl we si, Chineke me otú a, me kwa ihe ọzọ otú a: n'ihi na i ghaghi inwu, Jonatan. Ndi Israel we si Sọl, Jonatan, ọ̀ gānwu, bú onye zọputara nzọputa uku a n'Israel? ya buru ihe-árú: Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nke isi-ya gādaru ala; n'ihi na ya na Chineke aluwo ọlu ta. Ndi Israel we b͕aputa Jonatan, o we ghara inwu. Sọl we si n'iso ndi Filistia rigo: ndi Filistia we la n'ebe nke ha. Ma Sọl were ala-eze ahu, buru eze Israel, o we bue agha megide ndi-iro-ya nile buruburu, megide Moab, megide kwa umu Amon, megide kwa Edom, megide kwa ndi-eze Zoba, megide kwa ndi Filistia: ma n'ebe ọ bula ọ nēcheghari iru ọ nālub͕u ha. O we me ihe dìnkpà, tib͕u kwa Amalek, we naputa Israel n'aka ndi nāpunara ha ihe. Ma umu-ndikom Sọl bu Jonatan, na Ishvi, na Malki-shua: aha umu-ya ndinyom abua kwa: aha nke ada-ya bu Mirab, aha nke-ntà bu Maikal: aha nwunye Sọl bu Ahinoam nwa Ahimaaz: aha onye-isi usu-ndi-agha-ya bu Abnea nwa Nea, nwa-nne nna Sọl. Kish bu nna Sọl; Nea nna Abnea bu nwa Abiel. Agha we sie ike megide ndi Filistia ubọchi nile nke Sọl: mb͕e Sọl huru nwoke ọ bula bu dike, ma-ọbu nwoke ọ bula bu dìnkpà, o were ya n'onwe-ya.
I. SAMUEL 14:24-52 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ndị ikom Izrel nọ ọnọdụ nhụju anya nʼụbọchị ahụ, nʼihi na Sọl jiri ịṅụ iyi kechie ha, mgbe o kwuru sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ onye ga-eri nri ọbụla site ugbu a ruo anyasị, tutu ruo mgbe m bọsịrị ọbọ megide ndị iro m!” Nʼihi ya, o nweghị onye ọbụla nʼetiti ndị agha ya detụrụ ihe oriri ọnụ. Ndị agha ahụ niile banyere nʼọhịa ebe mmanụ aṅụ dị nʼala. Mgbe ha banyere nʼọhịa, ha hụrụ mmanụ aṅụ ebe ọ na-asọpụta, ma o nweghị onye metụrụ aka nʼọnụ ya, nʼihi na ha tụrụ egwu iyi ahụ ha ṅụrụ. Ma Jonatan anụghị na nna ya mere ka ndị ahụ ṅụọ iyi, ya mere, o setịpụrụ ọnụ ọnụ mkpanaka dị ya nʼaka rụta mmanụ aṅụ na ugbugbo ya, tinye nʼọnụ ya rachaa. Nke a mere ka ike ya laghachite. Ma otu onye agha gwara ya sị, “Nna gị ji ịṅụ iyi gbaa ndị agha niile iwu, sị, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ, onye riri nri taa. Ọ bụ nke a mere ndị mmadụ ji ada mba.’ ” Jonatan zara sị, “Nna m esitela nʼiwu dị otu a wetara ala anyị nsogbu. Lee ka m si nweta ike site na mmanụ aṅụ nta m rachara. Ọ garaghị aka mma ma a sị na ndị ikom riri ihe ha si nʼaka ndị iro ha kwata nʼagha? Ọ bụ na ogbugbu a gaara egbu ndị Filistia agaraghị adị ukwuu karịa?” Ma ndị agha Izrel bu agụụ tigbuo ndị Filistia, chụọkwa ha ọsọ site na Mikmash ruo Aijalon. Ha dakwara mba karịa. Ha dakwasịrị ihe a kwatara nʼagha, gbuo atụrụ na ehi na ụmụ ehi, bido iri anụ ha na ndụ nʼihi agụụ. Ma otu onye gwara Sọl sị, “Ndị ikom Izrel na-emehie megide ONYENWE ANYị site na iri anụ ọbara ya dị nʼahụ ya.” Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Ihe dị otu a jọgburu onwe ya. Nutenụ nkume ukwuu nʼebe a ugbu a.” Sọl sịrị, “Gaa nʼetiti ndị ikom a gwa ha, ‘Ka onye ọbụla weta ehi na atụrụ ha chọrọ igbu nʼebe a, ka e gbuo ha nʼebe a, rie anụ ha. Unu emehiela megide ONYENWE ANYị site nʼiri anụ ọbara dị nʼime ya.’ ” Ya mere, onye ọbụla wetara ehi ya nʼabalị ahụ, gbuo nʼebe ahụ. Emesịa, Sọl wuuru ONYENWE ANYị ebe ịchụ aja. Nke a bụ ebe ịchụ aja nke mbụ o wuru. Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị agha ya sị, “Ka anyị gaa chụọ ndị Filistia ọsọ nʼabalị a niile, ma gbukwaa onye ọbụla fọdụrụ nʼime ha.” Ndị agha ya zara sị, “Ọ dị mma, mee dịka ị kwuru.” Ma onye nchụaja sịrị, “Ka anyị buru ụzọ jụta ihe bụ uche Chineke.” Mgbe ahụ, Sọl jụrụ Chineke sị, “Ọ bụ m rịda gaa chụso ndị Filistia? Ị ga-enyefe ha nʼaka ndị Izrel?” Ma Chineke enyeghị ya ọsịsa ọbụla nʼụbọchị ahụ. Sọl gwara ndịisi agha Izrel okwu sị, “Ihe emebiela! Anyị aghaghị ịchọpụta ụdị mmehie anyị mere taa, nke mere ONYENWE ANYị ji jụ inye anyị ọsịsa. Nʼezie dịka ONYENWE ANYị, onye na-azọpụta Izrel na-adị ndụ, a sịkwarị na ọ bụ nwa m Jonatan ka a chọpụtara na ọ bụ ya ka ikpe mara, ọ ga-anwụ!” Ma ọ dịghị onye gwara ya ihe ọbụla. Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị Izrel niile okwu sị ha, “Guzonụ onwe unu nʼebe ahụ, mụ na nwa m Jonatan ga-eguzo onwe anyị nʼebe a.” Ndị ahụ zara sị, “Mee ihe ọbụla dị gị mma.” Mgbe ahụ, Sọl kpere ekpere nye ONYENWE ANYị, bụ Chineke Izrel, “Gịnị mere na ị zabeghị ohu gị taa? Ọ bụrụ na ikpe mara m maọbụ nwa m Jonatan, zaa site nʼUrim, ma ọ bụrụ ndị ikom Izrel ka ikpe mara, nye ọsịsa site na Tumim.” Nza ahụ mara Jonatan na Sọl, ma ikpe amaghị ndị ikom Izrel. Mgbe ahụ, Sọl kwuru sị, “Ugbu a feenụ nza nʼetiti mụ na Jonatan, nwa m nwoke.” Nza ahụ mara Jonatan. Sọl gwara Jonatan okwu sị ya, “Gwa m ihe i mere.” Jonatan zara sị ya, “Ọ bụ naanị mmanụ aṅụ ntakịrị ka m ji ọnụ mkpanaka m rụrụ rachaa. Ọ pụtara na m ga-anwụ nʼihi ya?” Mgbe ahụ, Sọl zara sị, “Nʼezie Jonatan, ị ghaghị ịnwụ. Ka Chineke meso m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si sie ike, ma ọ bụrụ na ị nwụghị nʼihi ihe a i mere.” Ma ndị ikom ahụ sịrị Sọl, “Jonatan ọ ga-anwụ, bụ onye a wetara nzọpụta a dị ukwuu nʼIzrel? Nke a apụghị ime! Dịka ONYENWE ANYị na-adị ndụ, ọ bụladị otu agịrị isi agaghị esi nʼisi ya dapụ, nʼihi na Chineke ejirila ya rụọ ọrụ ịtụnanya dị ukwuu taa.” Ya mere, ndị agha ahụ zọpụtara Jonatan, e gbukwaghị ya. Emesịa, Sọl kwụsịrị ndị agha ya ịchụ ndị Filistia ọsọ. Ndị Filistia nʼonwe ha lakwara nʼala nke ha. Site nʼoge Sọl malitere ịchị nʼIzrel, o buru agha megide ndị iro ha nʼakụkụ niile, ndị Moab, ndị Amọn, ndị Edọm, ndị eze Zoba na ndị Filistia. Ebe ọbụla o chere ihu ọ na-alụgbu. O buru agha dị ukwuu, lụgbuo ndị Amalek; ma zọpụta ndị Izrel site nʼaka ndị niile na-emegbu ha site nʼịpụnarị ha ihe ha nwere. Sọl mụtara ndị ikom atọ; Jonatan, Ishvi na Malkishua. Ọ mụtakwara ụmụ agbọghọ abụọ, Merab na Mikal. Aha nwunye Sọl bụ Ahinoam, ada Ahimaaz. Ọchịagha Sọl bụ Abna, nwa Nea, nwanne nna Sọl. Nea, nna Abna, na Kish, nna Sọl bụ ụmụnne. Ha bụ ụmụ Abiel. Ndị Izrel na ndị Filistia nọ nʼagha dị egwu ụbọchị niile Sọl bụ eze. Mgbe ọbụla Sọl hụrụ nwoke dị ike, maọbụ dimkpa, ọ na-eduru ya mee ya ka ọ bụrụ otu nʼime ndị agha ya.