I. SAMUEL 13:13-14
I. SAMUEL 13:13-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Samuel sịrị Sọl, “Ị kpara agwa onye nzuzu. I debeghị ihe ONYENWE ANYị Chineke gị nyere gị nʼiwu idebe. A si na i mere nke a, ọ gaara eme ka alaeze gị guzosie ike nʼebe Izrel nọ ruo mgbe niile. Ma ugbu a, alaeze gị agaghị adịgide. ONYENWE ANYị achọpụtala otu nwoke dịka ọchịchọ obi ya si dị, ọ họpụtakwala ya ịbụ eze nke ndị ya; nʼihi na ị debeghị ihe ONYENWE ANYị nyere gị nʼiwu.”
I. SAMUEL 13:13-14 Bible Nso (IGBOB)
Samuel we si Sọl, I mewo ihe-nzuzu: i debeghi ihe Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, bú nke O nyere gi n'iwu: n'ihi na ub͕u a Jehova gēmewori ka ala-eze-gi guzosie ike n'ebe Israel nọ rue mb͕e ebighi-ebi. Ma ub͕u a ala-eze-gi agaghi-eguzosi ike: Jehova achọputaworo Onwe-ya otù nwoke dika obi-Ya si chọ, Jehova enyewo kwa ya iwu ibu onye-ndú ndi-Ya, n'ihi na i debeghi ihe ahu nke Jehova nyere gi n'iwu.