I. SAMUEL 12:1-5
I. SAMUEL 12:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Samuel we si Israel nile, Le, egewom nti olu-unu n'ihe nile nke unu sirim, m'we mere unu eze. Ma ub͕u a, le, eze ahu nējeghari n'iru unu: ma mu onwem aghọwo agadi na onye-isi-awọ; ma umum ndikom, le, ha nọ n'etiti unu: ma mu onwem ejeghariwo n'iru unu site na mb͕e m'di na nwata rue ta. Lem: b͕agidem àmà n'iru Jehova, na n'iru onye nke Ya etere manu: ọ̀ bu ehi onye ka m'naraworo? ma-ọbu ìnyinya-ibu onye ka m'naraworo? ma-ọbu ònye ka m'meb͕uworo? ònye ka m'zọpiaworo? ma-ọbu n'àka onye ka m'naraworo ihe-nb͕aputa iji zopu anyam n'aru ya? m'gēnyeghachi kwa unu ya. Ha si, I meb͕ughi ayi, i zọpiaghi kwa ayi, i naraghi kwa ihe ọ bula n'aka nwoke ọ bula. Ọ si ha, Onye-àmà ka Jehova bu imegide unu, onye-àmà ka onye nke Ya etere manu bu kwa ta, na unu achọtaghi ihe ọ bula n'akam. Ha we si, Onye-àmà ka Ọ bu.
I. SAMUEL 12:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, Samuel gwara ụmụ Izrel sị, “Lee, emeelara m unu ihe unu rịọrọ, Enyela m unu eze. Ugbu a, unu enweela eze, onye bụ onyendu unu. Ma nʼebe mụ onwe m nọ, abụrụla m agadi isi awọ, ụmụ m ndị ikom so nọrọkwa nʼetiti unu. Abụ m onyendu unu site na mgbe m bụ okorobịa ruo taa. Lee m ka m guzo nʼihu unu. Gbaanụ ama megide m nʼihu ONYENWE ANYị na nʼihu onye ya o tere mmanụ. Onye ka m zuuru ehi ya? Onye ka m zuuru ịnyịnya ibu ya? Ọ dị onye m ghọgburu? Ọ dị onye m megburu? Ọ dị onye m si nʼaka ya nara ego aka azụ ime ka m ghara ikpe ikpe ziri ezi? Gwanụ m ma ọ bụrụ na m mere ihe ndị a, aga m emezi ya.” Ha zara sị, “Mba ọ dịbeghị mgbe ị ghọgburu anyị, maọbụ kpagbuo anyị, nʼụzọ ọbụla. O nweghịkwa onye i si nʼaka ya were ihe ọbụla.” Samuel zara sị ha, “ONYENWE ANYị bụ onye akaebe megide unu. Otu a kwa, onye ya o tere mmanụ bụ onye akaebe taa, na unu achọtaghị ihe ọbụla nʼaka m.” Ha zara sị, “E, ọ bụ onye akaebe!”