I. PITA 5:7-9
I. PITA 5:7-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi. Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ọ ga-ala nʼiyi. Guzosienụ ike nʼokwukwe unu. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nʼụdị ahụhụ a unu na-ahụ nʼụwa niile.
I. PITA 5:7-9 Bible Nso (IGBOB)
nātukwasinu Ya ncheb͕u nile unu nēcheb͕u onwe-unu, n'ihi na ihe nile bayere unu nēmetu Ya n'obi. Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi: ma nēguzogidenu ya, n'ihi na unu di ike n'okwukwe-unu, ebe unu matara na anēmezu otù ahuhu ahu n'aru ndi bu òtù umu-nna-unu ndi nọ n'uwa.