I. PITA 5:12-14
I. PITA 5:12-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ site nʼinyeaka Saịlas onye m hụtara dị ka nwanna kwesiri ntụkwasị obi ka m ji deere unu mkpụrụ okwu ole na ole ndị a nke m ji agbaa unu ume na-ekwupụtakwa na nke a bụ eziokwu dị nʼamara Chineke. Guzosienụ ike nʼime ya. Nwanyị ahụ nọ na Babilọn, nke a họpụtara unu na ya, na-ekele unu. Mak, ezi nwa m nwoke na-ekelekwa unu. Jirinụ isurita ọnụ ịhụnanya kelerịta onwe unu.
I. PITA 5:12-14 Bible Nso (IGBOB)
Site n'aka Silvanọs, nwa-nna-ayi kwesiri ntukwasi-obi, dika m'nāgu ya, ka m'nēdegara unu akwukwọ n'okwu ole-na-ole, nāriọ unu, nāb͕a kwa àmà na nka bu amara Chineke n'ezie: nēguzosinu ike nime ya. Nwanyi ahu nke nọ na Babilon, nke soro unu buru onye arọputaworo, nēkele unu; nwam, bú Mak, nēkele kwa unu. Werenu isutu-ọnu nke ihu-n'anya nēkelerita onwe-unu. Udo diri unu nile ndi nọ nime Kraist.