I. PITA 5:1-6
I. PITA 5:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mụ onwe m, onye bụ okenye na onyeama banyere ahụhụ Kraịst, bụrụkwa onye ga-eso keta oke nʼebube ya nke a gaje ikpughe, a na m arịọ ndị okenye nʼetiti unu arịrịọ a, na-azụnụ igwe atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nʼaka. Ka unu na-elekọta ha, ọ bụghị nʼihi na unu agaghị ime otu a, kama ọ bụ ihe sitere nʼọchịchọ obi unu, dị ka Chineke chọrọ ka unu mee. Ọ bụkwaghị nʼihi ego unu ga-enweta, kama ọ bụ ịnụ ọkụ unu nʼije ozi. Unu abụla ọkaaka nʼebe ndị e nyefere unu nʼaka nọ. Kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye igwe atụrụ ahụ. Ma mgbe Onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga-abịa unu ga-anata okpueze ebube nke na-agaghị agbanwe agbanwe. Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.” Ya mere, wedanụ onwe unu nʼokpuru aka dị ike nke Chineke, ka o bulie unu elu nʼoge ya.
I. PITA 5:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere, ariọm ndi-okenye nọ n'etiti unu, onye mu onwem bu okenye-ibe-unu, ya na onye-àmà nke ahuhu nile nke Kraist, abukwam onye-nnwekọ nke ebube ahu nke agaje ikpughe: Nāzùnu ìgwè aturu ntà Chineke nke di n'etiti unu, nēlekọta ha anya, ọ bughi n'ihi na nkpà nākpa unu, kama site n'ọchichọ obi, dika Chineke chọrọ; ọ bughi kwa n'ihi urù nēweta ihere, kama n'ihi na unu di ọku n'obi; ọ bughi kwa dika agāsi na unu nēme ndi bu ihe-nketa dika unu bu ndi-nwe-ha, kama nēme onwe-unu ihe-atù ìgwè aturu ntà ahu gēṅomi. Mb͕e agēme kwa ka Onye-isi-ọzùzù-aturu puta ìhè, unu gānata okpu-eze nke ebube ahu, nke nādighi-atalata. Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n'okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n'ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara. Ya mere wedanu onwe-unu n'okpuru aka di ike nke Chineke, ka O we welie unu elu n'oge nke Ya