I. PITA 2:11-25
I. PITA 2:11-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi ya, ndị enyi m, ana m arịọ unu, dịka ndị bụ ọbịa na ndị na-agba ọsọ ndụ nʼụwa a, nke unu bụ, na-asị unu, wezuganụ onwe unu site nʼagụụ mmehie nke na-ebuso mkpụrụobi unu agha. Bienụ ezi ndụ nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ọ ga-abụ na a sị na ha ebo unu ebubo ime ihe ọjọọ, ha ga-ahụ ọrụ ọma unu, ma nye Chineke otuto nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa. Werenụ onwe unu nyefee, nʼihi Onyenwe anyị, nʼokpuru ọchịchị niile e guzobere nʼetiti ụmụ mmadụ, ma ọchịchị ahụ ọ bụ nke eze, dịka onye ike ya kacha nke ibe ya, maọbụ nke ọchịchị gọvanọ, onye e guzobere nʼihi ịta ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ, na ito ndị na-eme ezi ihe otuto. Nʼihi na ọ bụ uche Chineke na unu ga-esite nʼezi ọrụ unu kpuchie ọnụ ndị ahụ na-esite na-amaghị ihe ha, na-ekwu okwu nzuzu. Na-ebinụ ndụ dị ka ndị nwere onwe ha, ma unu ejikwala mnwere onwe unu mere ihe mkpuchi nke ajọ ihe. Bienụ dịka ụmụodibo Chineke. Sọpụrụnụ mmadụ niile dịka o si kwesi. Gosi ndị niile kwere ekwe ịhụnanya. Tụọ Chineke egwu, ma na-asọpụrụ eze. Ndị ohu, ruberenụ ndị nwe unu isi, na-enyekwa ha nsọpụrụ na ugwu ruuru ha. Unu emela nke a nye naanị ndị bụ ezi mmadụ, na ndị nwere obiọma nʼebe unu nọ, kama meekwanụ ya ọ bụladị nye ndị afọ tara mmiri. Nʼihi na nke a bụ ihe inye ekele ma ọ bụrụ na unu ejiri ntachiobi na-edi ahụhụ na-ezighị ezi na-adakwasị unu, nʼihi na unu na-eme ihe Chineke na-achọ. Ma o nweghị otuto ọbụla dịrị unu mgbe a tara unu ahụhụ nʼihi na unu mejọrọ, unu na-edikwa ya? Ma ọ bụrụ na unu enwee ntachiobi mgbe a na-ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọma unu na-eme, nke a na-ewetara Chineke otuto. Ọ bụ nʼihi ihe dị otu a, ka e jiri kpọọ unu, nʼihi na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼihi unu. Ọ bụkwa ihe ịmaatụ nye unu. Na-esonụ nzọ ụkwụ ya. “O nweghị mgbe ọbụla o mehiere, o nwekwaghị mgbe onye ọbụla nụrụ okwu aghụghọ nʼọnụ ya.” O kwutọghị onye ọbụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọbụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama o were ya nyefee nʼaka onye ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi. Nʼelu obe ahụ, o buuru mmehie anyị niile bokwasị onwe ya mgbe ọ nwụrụ, ime ka anyị nwee ike ịbụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị; ma dịrị ndụ nʼebe ezi omume dị. Ọ bụkwa site nʼapa ọnya dị ya nʼahụ ka o ji gwọọ unu. Na mbụ, unu dị ka ụmụ atụrụ na-awagharị na-achọ ụzọ, ma ugbu a, e meela ka unu laghachikwute Onye ahụ na-azụ unu dị ka atụrụ, na Onye na-elekọtakwa mkpụrụobi unu anya.
I. PITA 2:11-25 Bible Nso (IGBOB)
Ndi m'huru n'anya, ariọm unu dika ndi-ọbìa na ndi nọ dika ọbìa, ka unu ghara ime ihe ọjọ di iche iche nāgu anu-aru, nke bu ihe nēbu agha imegide nkpuru-obi; nēbinu obi-unu nke-ọma n'etiti ndi mba ọzọ; ka ha we site n'ọlu ọma nile unu, nke ha nēle anya, nye Chineke otuto n'ubọchi nleta ahu nime ihe ahu ha nēkwutọ unu nime ya dika ndi nēme ihe ọjọ. Donu onwe-unu n'okpuru ibu-isi ọ bula madu debere n'ihi Onye-nwe-ayi; ma ọ bu eze, dika onye nọ n'ike n'elu unu; ma-ọbu ndi-isi, dika ndi anēzite site n'aka-ya ka ha bọ̀ ọ́bọ̀ n'aru ndi nēme ihe ọjọ, ka ha to kwa ndi nēme ezi ihe. N'ihi na otú a ka ọchichọ nke Chineke si di, ka unu site n'ime ezi ihe me ka amaghi-ihe nke ndi nēnweghi uche kpuchie ọnu: dika ndi nwere onwe-ha, ma unu enweghi inwe-onwe-unu ahu dika ihe-nkpuchi nke ihe ọjọ, kama dika ndi-orù nke Chineke. Sọpurunu madu nile. Hunu òtù ndi bu umu-nna n'anya. Nātunu egwu Chineke. Nāsọpurunu eze-unu. Ndi nēje ozi, nēdonu onwe-unu n'okpuru ndi-nwe-unu n'egwu nile; ọ bughi nání n'okpuru ndi bu ezi madu ndi nwe-kwa-ra obi-ọma, kama ọ bu kwa n'okpuru ndi b͕agọrọ ab͕agọ. N'ihi na nka bu ihe-ekele, ma ọ buru na onye ọ bula nātachi obi n'ihe-nwuta di iche iche n'ihi akọ-na-uche n'ebe Chineke nọ, nāhu ahuhu nke nēzighi ezi. N'ihi na àha otuto gini di ya, ma ọ buru na, mb͕e unu nēmehie, mb͕e eti kwa unu aka, unu atachi obi na ya? N'ihi na akpọrọ unu ime nka: n'ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu n'ihi unu, nārapuru unu ihe ilere anya, ka unu we so ije-ukwu-Ya nile: Onye ọ dighi nmehie ọ bula O mere, ahughi kwa aghughọ n'ọnu-Ya: Onye, mb͕e anēkwuto Ya, Ọ dighi-ekwutọghachi ọzọ; mb͕e Ọ nāhu ahuhu, Ọ dighi-aba nba; kama Ọ rara Onwe-ya nye n'aka Onye ahu Nke nēkpe ikpé ziri ezi: Onye Ya onwe-ya, dika àjà achuru, būru nmehie nile ayi n'aru-Ya n'elu osisi ahu, ka ayi, ebe ayi nwuworo n'ebe nmehie nile di, ka ayi we di ndu n'ebe ezi omume di; Onye eji ọnyá-utari-Ya me ka unu nwe ezi ndu. N'ihi na unu nēhieri dika aturu; ma ub͕u a unu chigharikutere Onye ahu Onye nāzù nkpuru-obi-unu dika anāzù aturu, Onye nēlekọta kwa ha anya.