I. PITA 2:1-3
I. PITA 2:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, wezuganụ nʼibu iro nʼobi na aghụghọ niile unu, kwụsịnụ ịgha ụgha, ịbụ ndị ihu abụọ, ndị na-ekwo ekworo, na ndị na-ekwutọ mmadụ ibe ha. Dịka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, bụrụnụ ndị agụụ ịṅụ mmiri ara nke Mmụọ Nsọ a na-agwaghị ihe ọbụla na-agụ, ka unu nwee ike site na ya na-eto eto nʼime nzọpụta unu. Ugbu a, unu detụrụla ya ire matakwa na Onyenwe anyị dị mma.
Kesaa
Gụọ I. PITA 2I. PITA 2:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere, tupunu ihe ọjọ nile, na aghughọ nile, na iru-abua, na ekworo, na nkwutọ nile di iche iche, dika umu amuru ọhu, ka agu miri-ara nke okwu Chineke, nke aghughọ nādighi ya, nāgusi unu ike, ka unu we were ya nētó etó rue nzọputa; ọ buru na unu deturu n'ire na Onye-nwe-ayi bu onye nwere obi-ọma
Kesaa
Gụọ I. PITA 2