I. PITA 1:6-7
I. PITA 1:6-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼime ihe ndị a ka unu na-aṅụrị oke ọṅụ, ọ bụ ezie na nʼoge ndị a dị nta, unu agabigala ọtụtụ ihe mgbu nʼihi ụdị ọnwụnwa dị iche iche bịakwasịrị unu. Ọnwụnwa ndị a na-abịa ime ka okwukwe unu, nke dị oke ọnụahịa karịa ọlaedo na-ala nʼiyi nʼagbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya; bụrụ nke ga-eweta otuto, na ebube, na nsọpụrụ, mgbe e mere ka Jisọs Kraịst pụta ìhè.
Kesaa
Gụọ I. PITA 1I. PITA 1:6-7 Bible Nso (IGBOB)
Nke obi nātọ unu utọ nke-uku nime ya, ọ bu ezie na emere ka o wuta unu n'ọnwunwa di iche iche nwa oge ub͕u a, ma asi na ọ di nkpà, ka nnwaputa nke okwukwe-unu, ebe ọ dikariri ọla-edo oké ọnu-ahia nke-uku, bú ọla-edo nke nāla n'iyì, ọ bu ezie na anēji ọku nwaputa ya, ka ewe hu nnwaputa ahu na ọ nēweta otuto na ebube na nsọpuru nime nkpughe nke Jisus Kraist
Kesaa
Gụọ I. PITA 1