I. PITA 1:3-8
I. PITA 1:3-8 Bible Nso (IGBOB)
Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye muru ayi ọzọ, dika oké ebere-Ya si di, ka ayi we nwe olile-anya di ndu, site na nbilite ahu nke Jisus Kraist si na ndi mwuru anwu bilite, ka ayi we keta nketa nke anāpughi imebi, nke anādighi-emeru kwa emeru, nke nādighi-atalata kwa, nke edebeworo n'elu-igwe nye unu, ndi ewere ike nke Chineke nēche nche site n'okwukwe rue nzọputa nke edoziworo ikpughe n'oge ikpe-azu. Nke obi nātọ unu utọ nke-uku nime ya, ọ bu ezie na emere ka o wuta unu n'ọnwunwa di iche iche nwa oge ub͕u a, ma asi na ọ di nkpà, ka nnwaputa nke okwukwe-unu, ebe ọ dikariri ọla-edo oké ọnu-ahia nke-uku, bú ọla-edo nke nāla n'iyì, ọ bu ezie na anēji ọku nwaputa ya, ka ewe hu nnwaputa ahu na ọ nēweta otuto na ebube na nsọpuru nime nkpughe nke Jisus Kraist: Onye unu huru n'anya, ọ bu ezie na unu ahughi Ya anya; Onye unu kwere na Ya, ọ bu ezie na unu adighi-ahu Ya anya ub͕u a, obi we nātọ unu utọ nke-uku n'ọṅù nke anāpughi ikwu okwu nke enyewo-kwa-ra ya otuto
I. PITA 1:3-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otuto dịrị Chineke Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst! Site nʼịba ụba nke ebere ya, o nyela anyị ndụ ọhụrụ baa nʼolileanya dị ndụ site na mbilite nʼọnwụ Jisọs Kraịst. Anyị nwekwara ihe nketa nke na-apụghị imebi emebi, nke na-agaghị ere ure, maọbụ gbanwee ụdịdị ya, nke e debeere anyị nʼeluigwe. Anyị bụ ndị e sitere nʼokwukwe na-echekwa nʼike Chineke, tutu ruo ọbịbịa nzọpụta ahụ, nke a na-ejikere ime ka ọ pụta ìhè nʼọgwụgwụ oge. Nʼime ihe ndị a ka unu na-aṅụrị oke ọṅụ, ọ bụ ezie na nʼoge ndị a dị nta, unu agabigala ọtụtụ ihe mgbu nʼihi ụdị ọnwụnwa dị iche iche bịakwasịrị unu. Ọnwụnwa ndị a na-abịa ime ka okwukwe unu, nke dị oke ọnụahịa karịa ọlaedo na-ala nʼiyi nʼagbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya; bụrụ nke ga-eweta otuto, na ebube, na nsọpụrụ, mgbe e mere ka Jisọs Kraịst pụta ìhè. Ọ bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ ya mgbe ọbụla, ma unu hụrụ ya nʼanya, ọ bụkwa ezie na unu adịghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu kwere na ya. Unu jupụtakwara nʼọṅụ ahụ dị ebube nke ọnụ na-apụghị ịkọwa.