I. NDI-EZE 9:15-28
I. NDI-EZE 9:15-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nke a bụ akụkọ banyere ndị ọrụ mmanye niile eze bụ Solomọn chịkọtara maka ịrụ ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị, na ụlọeze nke ya, na ebe e wusiri ike nke Milo, na mgbidi Jerusalem, Hazọ, Megido nakwa Gaza. Fero eze Ijipt buru agha na mbụ merie Gaza, kpọọ ya ọkụ, gbukwaa ọtụtụ ndị Kenan bi nʼobodo ahụ, were ya nye nwa ya nwanyị, bụ nwunye Solomọn, ka ọ bụrụ ihe o ji duo ya ụlọ. Solomọn wugharịrị obodo Gaza, wuokwa ndịda Bet-Horon, Baalat na Tadmọ nke dị nʼọzara nʼime ala ya. O wukwara ọtụtụ obodo ebe nchịkọba ihe, obodo ebe idebe ụgbọ agha na ịnyịnya ya niile. O wuru ihe ọbụla gụrụ obi ya agụụ iwu na Jerusalem, Lebanọn na nʼoke ala ahụ niile ọ na-achị. Ndị niile fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị Amọrait, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na Jebus (ndị ahụ abụghị ndị Izrel), ndị ụmụ ụmụ ha niile fọdụrụ nʼala ahụ, ndị ahụ ndị Izrel na-enweghị ike egbuchapụ, ndị a ka Solomọn mere ndị ọrụ mmanye na ndị ohu, nke a bụkwa ọnọdụ ha ruo taa. Ma Solomọn emeghị ka onye Izrel ọbụla bụrụ ohu. Kama ha bụ ndị ikom agha, ndịisi ọrụ nʼọchịchị, ndịisi ndị ọchịagha, ndịisi ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya agha ya. Ndị a bụkwa ndịisi na-ahụ ihe banyere ọrụ niile nke Solomọn ji nʼaka. Ndị Izrel dị narị ise na iri ise (550), ka e mere ndịisi na-elekọta ndị ọrụ Solomọn. Emesịa, ada Fero sitere nʼobodo Devid pụta gbagoo nʼụlọeze nke Solomọn wuuru ya. Solomọn wukwara ebe mpụta nke ụlọ ahụ. Ugboro atọ nʼafọ, ka Solomọn na-achụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼelu ebe ịchụ aja o wuru nye ONYENWE ANYị, tinyere aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ ọ na-achụ nʼihu ONYENWE ANYị. O si otu a wuchaa ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị. Eze Solomọn wukwara ọtụtụ ụgbọ mmiri nʼEziọn Geba, bụ nke dị nʼakụkụ Elat, nʼọnụ mmiri Oke osimiri Uhie nʼala Edọm. Hiram zigaara ndị ikom ya na-anya ụgbọ, ndị maara ihe banyere ime njem osimiri nke ọma, ka ha soro ndị ikom Solomọn jee ozi nʼime ụgbọ ndị a. Ha nyaara ụgbọ gaa Ọfịa, site nʼebe ahụ bulatara eze Solomọn ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru puku kilogram iri na anọ na narị abụọ na asatọ.
I. NDI-EZE 9:15-28 Bible Nso (IGBOB)
Ma nka bu ihe kpatara usu ndi nēfè òfùfè nke eze, bú Solomon, weputara; iwu ulo Jehova, na ulo nke aka ya, na Milo, na mb͕idi Jerusalem, na Hezoa, na Megido, na Gezea. N'ihi na Fero, bú eze Ijipt, rigoro, were Gezea, sure ya n'ọku, b͕ue ndi Kenean ndi bi n'ọbodo ahu, were ya nye nwa-ya nwayi, bú nwunye Solomon, ka ọ buru ihe idu-ulo. Solomon we wue Gezea, na Bet-horon di n'okpuru, na Bealat, na Tema n'ọzara, n'ala-ya, na obodo nile nke nchikọbata-ihe nke Solomon nwere, na obodo nile nke ub͕ọ-ala-ya, na obodo nile nke ndi-inyinya-ya, na ihe di Solomon ezi nma n'obi, bú nke di ya ezi nma n'obi iwu na Jerusalem, na nime Lebanon, na n'ala nile ọ nāchi. Ma ndi nile fọduru n'etiti ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, ndi nēsiteghi n'umu Israel; umu-ha ndi fọduru inọchi ha n'ala, ndi umu Israel nāpughi iwezuga ka ebibie ha, Solomon we si nime ha weputa usu ndi nēfè òfùfè, bú ndi-orù, rue ta. Ma ọ dighi orù Solomon mere site n'umu Israel: kama ndi ahu bu ndikom agha, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-ọchi-agha-ya, na ndi-isi ub͕ọ-ala-ya na ndi-inyinya-ya. Ndia bu ndi-isi nke ndi ahu edoro ndi-isi, ndi bu ndi-isi n'ozi anējere Solomon, nnù madu na ọgu asa na iri, ndi nwere ike n'aru ndi nālu ọlu n'ije-ozi ahu. Otú ọ di, nwa-nwayi Fero siri n'obodo Devid rigorue ulo-ya nke Solomon wuru nye ya: mb͕e ahu ka o wuru Milo. Ub͕ò atọ n'arọ ka Solomon surere àjà-nsure-ọku na àjà-udo nye Jehova n'elu ebe-ichu-àjà nke o wuru, o we sure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ tiyere ya n'elu ebe-ichu-àjà nke di n'iru Jehova. O we wuzue ulo ahu. Eze, bú Solomon, me-kwa-ra ub͕ọ n'Ezion-geba, nke di n'akuku Ilot, n'usọ Oké Osimiri Uhie, n'ala Edom. Hairam we zìe ndi-orù-ya n'ub͕ọ-ya, bú ndi-ub͕ọ ndi mara oké osimiri, ha na ndi-orù Solomon. Ha we biarue Ofia, si n'ebe ahu weta ọla-edo, nnù talent na orú talent, wetara eze, bú Solomon.