I. NDI-EZE 8:12-21
I. NDI-EZE 8:12-21 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ahu Solomon siri, Jehova asiwo na O gēbi n'oké ọchichiri. N'ezie ewuworom I ulo obibi, bú ọnọdu guzosiri ike ebe I gēbi rue mb͕e ebighi-ebi. Eze we chigharia iru-ya, gọzie nkpọkọta nile nke Israel: nkpọkọta nile nke Israel nēguzo kwa. Ọ si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye were ọnu-Ya gwa Devid, bú nnam, okwu, were kwa aka-Ya mezue ya, si, Site n'ubọchi mb͕e M'mere ka ndim, bú Israel, si n'Ijipt puta, arọputaghm obodo n'ebo nile nke Israel iwu ulo, ka aham we di n'ebe ahu; ma arọputaram Devid ibu onye-isi ndim, bú Israel. O we di n'obi Devid, bú nnam, iwuru aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo. Jehova we si Devid, bú nnam, N'ihi na ọ di n'obi-gi iwuru aham ulo, i mere nke-ọma na ọ di n'obi-gi: otú ọ di, gi onwe-gi agaghi-ewu ulo ahu: kama, nwa-gi nwoke nke nēsi n'úkwù-gi puta, onye ahu gēwuru aham ulo. Jehova emewo kwa ka okwu-Ya nke O kwuru guzosie ike; m'we bilie n'ọnọdu Devid, bú nnam, nọkwasi n'oche-eze Israel, dika Jehova kwuru, m'we wuere aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo, doro ib͕e ahu ọnọdu n'ebe ahu, bú ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu Jehova di n'ebe ahu, bú ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na nna-ayi-hà b͕ara, mb͕e O mere ka ha si n'ala Ijipt puta.
I. NDI-EZE 8:12-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, Solomọn sịrị, “ONYENWE ANYị ekwuola na ọ ga-ebi nʼoke igwe ojii. Ma nʼezie, ewuola m ụlọnsọ pụrụ iche, maa mma nye gị, ebe ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.” Dịka ọgbakọ Izrel niile na-eguzo nʼebe ahụ, eze chigharịrị onwe ya chee ha ihu, gọzie ha. Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Otuto dịrị ONYENWE ANYị, bụ Chineke Izrel, onye ji aka ya mezuo nkwa nke o sitere nʼọnụ ya kwee nna m Devid. Nʼihi na o kwuru sị, ‘Site nʼụbọchị ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta ndị m, ahọpụtaghị m obodo ọbụla nʼebo ọbụla nke Izrel, ka e wuru m ụlọnsọ ka Aha m dịrị nʼebe ahụ. Ma a họrọla m Devid ị bụ onye ga-achị ndị m Izrel.’ “Nna m, Devid bu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha ONYENWE ANYị, bụ Chineke nke Izrel. Ma ONYENWE ANYị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha m. Ma otu ọ dị, ọ bụghị gị ga-ewu ụlọnsọ ukwu ahụ, kama ọ bụ nwa gị nwoke, anụ ahụ gị na ọbara gị; ọ bụ ya ga-ewu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.’ “Ugbu a, ONYENWE ANYị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna m Devid, ugbu a, ana m anọdụ nʼocheeze nke Izrel dịka ONYENWE ANYị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye Aha ONYENWE ANYị, bụ Chineke nke Izrel. Edoziekwala m ọnọdụ ebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ ga-adị, nʼime ya ka ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị dị, bụ nke ya na nna nna anyị ha gbara, mgbe o mere ka ha si nʼala Ijipt pụta.”