I. NDI-EZE 22:51-53
I. NDI-EZE 22:51-53 Bible Nso (IGBOB)
Ehazaia nwa Ehab malitere ibu eze Israel nime Sameria n'arọ nke-iri-na-asa nke Jehoshafat, bú eze Juda, o we buru eze Israel arọ abua. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je kwa ije n'uzọ nna-ya, na n'uzọ nne-ya, na n'uzọ Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie. O fè-kwa-ra Beal òfùfè, kpọ isi ala nye ya, we kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe, dika ihe nile si di nke nna-ya mere.
I. NDI-EZE 22:51-53 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ahazaya nwa Ehab, malitere ịbụ eze Izrel na Sameria, nʼafọ iri na asaa nke ọchịchị Jehoshafat, eze Juda. Ma ọ chịrị Izrel naanị afọ abụọ. O mere ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYị, nʼihi na o sooro ụzọ ọjọọ niile nke nna na nne ya, na ụzọ ọjọọ nke Jeroboam nwa Nebat, onye mere ka Izrel mee mmehie. Ọ fekwara arụsị Baal ofufe, kpọọkwa isiala nye ya, si otu a kpasuo ONYENWE ANYị, Chineke Izrel iwe, dịka nna ya mere.