I. NDI-EZE 17:1-5
I. NDI-EZE 17:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Elaija, bu onye Tisbe, onye sitere na ndi-nnọdu nke Gilead, we si Ehab, Jehova, bú Chineke nke Israel, nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, igirigi ma-ọbu miri-ozuzo agaghi-adi ma-ọli n'arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di. Okwu Jehova we rue ya nti, si, Si n'ebe a pua, chere onwe-gi iru n'Iru-anyanwu, zo onwe-gi na miri-iyi Kerit, nke di n'iru Jọdan. O gēru kwa, na i gāṅu miri sitere na miri-iyi ahu; ọ bu kwa ugolo-ọma ka M'nyeworo iwu izù gi n'ebe ahu. O we je, me dika okwu Jehova si di: o je biri na miri-iyi Kerit, nke di n'iru Jọdan.
I. NDI-EZE 17:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ugbu a, Ịlaịja onye Tishbe, onye si obodo Tishbe, nke dị nʼala Gilead, sịrị Ehab, “Eji m aha ONYENWE ANYị Chineke Izrel dị ndụ, onye m na-efe na onye m na-ejere ozi na-agwa gị na igirigi agaghị ada, mmiri agaghị ezo ọzọ nʼafọ ndị a na-abịa karịa ma ọ bụghị naanị site nʼokwu ọnụ m!” Okwu ONYENWE ANYị rutere Ịlaịja ntị, sị ya, “Si nʼebe a pụọ. Soro ụzọ ọwụwa anyanwụ, gaa zoo onwe gị nʼakụkụ iyi Kerit, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ya, nke bụ nʼihu Jọdan. Nọdụ nʼebe ahụ ṅụọ mmiri si nʼiyi ahụ, riekwa nri ọbụla ụmụ ugolọma ga-ebutere gị, nʼihi na enyela m ha iwu ka ha nye gị nri.” O mere ihe ONYENWE ANYị gwara ya ka o mee. Ọ gara nʼakụkụ iyi nta Kerit nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan nọrọ nʼebe ahụ.