I. NDI-EZE 14:29-31
I. NDI-EZE 14:29-31 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Rehoboam, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda? Agha dịgidere nʼetiti Rehoboam na Jeroboam ụbọchị niile nke ndụ ha. Rehoboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn. Abija nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Kesaa
Gụọ I. NDI-EZE 14I. NDI-EZE 14:29-31 Bible Nso (IGBOB)
Ma okwu Rehoboam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? Ma agha di n'etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile. Rehoboam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: aha nne-ya bu Neama, bú nwayi Amon. Abaijam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu-ya.
Kesaa
Gụọ I. NDI-EZE 14