I. NDI-EZE 12:25-33
I. NDI-EZE 12:25-33 Bible Nso (IGBOB)
Jeroboam we wue Shekem n'ugwu Efraim, biri n'ebe ahu; o si n'ebe ahu pua, wue Penuel. Jeroboam we si n'obi-ya, Ub͕u a ka ala-eze gālaghachikuru ulo Devid: ọ buru na ndi nka arigo ichu àjà n'ulo Jehova na Jerusalem, obi ndi nka gālaghachikuru kwa onye-nwe-ha, bú Rehoboam eze Juda; ha gēb͕ukwam, laghachikuru Rehoboam, bú eze Juda. Eze we me ka adua ya ọdu, o we me umu-ehi abua nke ọla-edo; ọ si ha, Unu arigozuwo Jerusalem; le chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa. Ọ dọba otù nime Bet-el, tiye nke-ọzọ nime Dan. Ihe a we ghọ nmehie: ndi Israel we je n'iru otù nime ha, rue Dan. O me ulo nke ebe di elu, me kwa ndi-nchu-àjà sitere n'ọnu-ọgugu ndi Israel nile, ndi nēsiteghi n'umu Livai. Jeroboam we me ememe n'ọnwa nke-asatọ, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu, dika ememe nke di na Juda, o we rigorue ebe-ichu-àjà ahu; otú a ka o mere na Bet-el, ichuru umu-ehi ahu, bú nke o mere, àjà: o guzo na Bet-el ndi-nchu-àjà nke ebe di elu nke o mere. Ọ rigorue ebe-ichu-àjà nke o mere na Bet-el n'ubọchi nke-iri-na-ise n'ọnwa nke-asatọ, bú n'ọnwa nke ọ chèputara n'obi-ya: o we mere umu Israel ememe, rigorue ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
I. NDI-EZE 12:25-33 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, Jeroboam wusiri Shekem dị nʼala ugwu Ifrem ike, biri nʼebe ahụ. Nʼebe ahụ ka o si pụọ, gaa wuo obodo Peniel. Ma Jeroboam chere nʼobi ya, sị “Ugbu a, ka alaeze nwere ike laghachikwa nʼaka ụlọ Devid. Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mmadụ gaa ịchụ aja nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị nke dị na Jerusalem, obi ha nwere ike laghachikwuru onyenwe ha, bụ Rehoboam eze Juda. Ha ga-egbu m, laghachikwuru eze Rehoboam.” Mgbe ọ natachara ndụmọdụ, eze kpụrụ ụmụ ehi ọlaedo abụọ. Ọ sịrị ndị mmadụ, “Ọ bụ oke ọrụ nye unu ịgbago Jerusalem. Leenụ chi unu, ndị Izrel, ndị sitere nʼIjipt kpọpụta unu.” Otu nʼime ha ka o guzobere na Betel, tinyekwa nke ọzọ na Dan. Ihe a ghọrọ mmehie dịrị ha, nʼihi na ndị mmadụ na-abịa kpọọ isiala nye nke dị na Betel ma gaakwa ebe dị anya, dịka Dan, nʼihi ife ehi ọlaedo nke dị nʼebe ahụ ofufe. Jeroboam wuru ebe ịchụ aja nʼebe dị elu dị iche iche. Ọ họpụtara ndị nchụaja site nʼetiti ndị Izrel niile, nʼagbanyeghị na ha abụghị ndị Livayị. O hiwere mmemme a na-eme nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke asatọ, dịka mmemme a na-eme na Juda. Ọ chụkwara aja nʼebe ịchụ aja. O mere nke a na Betel, chụọrọ ụmụ ehi ọlaedo ahụ ọ kpụrụ aja. O tinyere ndị nchụaja nʼọrụ nʼebe niile dị elu nke o mere ka ha dịrị na Betel. Nʼụbọchị nke iri na ise, nʼọnwa asatọ, bụ ọnwa nke ya onwe ya chepụtara, ọ chụrụ aja dị iche iche nʼelu ebe ịchụ aja o wuru na Betel. Ya mere, o hiwere mmemme a ka ọ dịịrị ndị Izrel niile; ya onwe ya kwa gara chụọ aja onyinye dị iche iche nʼelu ebe ịchụ aja.