Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI-EZE 12:1-20

I. NDI-EZE 12:1-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Rehoboam gara Shekem, nʼihi na Izrel niile zukọrọ ebe ahụ ime ya eze. Mgbe Jeroboam nwa Nebat nụrụ nke a (ọ ka nọ nʼIjipt ebe ọ gbagara ọsọ ndụ site nʼaka eze Solomọn), o sitere Ijipt lọta. Ya mere, ha ziri ozi kpọọ Jeroboam, ya na ọgbakọ Izrel niile jekwuru Rehoboam sị ya: “Nna gị boro anyị ibu arọ, ma ugbu a mee ka ibu arọ na ịyagba arọ a nke o bokwasịrị anyị, dị mfe, anyị ga-ejere gị ozi.” Rehoboam zara ha sị, “Laanụ, ụbọchị atọ gasịa unu bịaghachikwutenụ m.” Nʼihi ya ndị ahụ lara. Mgbe ahụ, eze Rehoboam gara ịnata ndụmọdụ nʼaka ndị okenye, bụ ndị jeere nna ya Solomọn ozi nʼoge ọ dị ndụ, sị ha, “Olee ndụmọdụ unu ga-enye m maka mụ inye ndị a ọsịsa?” Ha zara ya, “Ọ bụrụ na ị ga-abụ odibo nye ndị a taa, jeere ha ozi, nyekwa ha ọsịsa dị mma, ha ga-anọgide bụrụ ndị ohu gị mgbe niile.” Ma ọ nabataghị ndụmọdụ ndị okenye nyere ya, ọ gakwuru ụmụ okorobịa ndị ya na ha tokọrọ, bụkwa ndị na-ejere ya ozi, ka ha nye ya ndụmọdụ. Rehoboam jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ndụmọdụ unu? Gịnị bụ ọsịsa anyị ga-enye ndị a na-asị, ‘Mee ka ibu arọ nna gị bokwasịrị anyị dị mfe’? ” Ụmụ okorobịa ahụ, bụ ndị ya na ha tokọrọ, zaghachiri sị, “Gwa ndị ahụ sịrị gị, ‘Nna gị bokwasịrị anyị ibu arọ, ma mee ka ibu anyị dị mfe,’ ị ga-agwa ha, sị, ‘Mkpịsịaka nta dị nʼaka m gbara okpotokpo karịa ukwu nna m. Nna m boro unu ibu arọ; aga m atụkwasị ihe nʼibu ahụ mee ka ọ dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, maọbụ akpị ka m ga-eji mekpaa unu ahụ.’ ” Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Jeroboam na ndị Izrel niile bịaghachiri ịnụrụ ọsịsa Rehoboam, dịka eze kwuru, sị, “Laghachitenụ nʼụbọchị nke atọ.” Eze sara ndị a okwu nʼolu dị ike. Ọ jụrụ ndụmọdụ nke ndị okenye nyere ya, ma gbasoro ndụmọdụ nke ụmụ okorobịa nyere. Ọ sịrị, “Nna m mere ka ibu unu dị arọ, aga m eme ka ibu unu dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, aga m eji akpị mekpaa unu ahụ.” Ya mere, eze aṅaghị ndị ahụ ntị, nʼihi mgbanwe nke ọnọdụ niile a sitere nʼebe ONYENWE ANYị nọ, ka e mezuo okwu ahụ ONYENWE ANYị gwara Jeroboam nwa Nebat site nʼọnụ Ahija onye Shilo. Mgbe Izrel niile hụrụ na eze jụrụ ige ha ntị, ha zaghachiri ya sị, “Olee oke anyị nwere nʼime Devid? Olee ihe nketa anyị nwere nʼime nwa Jesi? Ndị Izrel, laanụ nʼụlọ ikwu unu! Gị Devid lekọtakwa ụlọ nke gị.” Ya mere, ndị Izrel lara nʼụlọ ha. Ma banyere ndị Izrel bi nʼobodo niile nke Juda, Rehoboam gara nʼihu bụrụ eze ha. Eze Rehoboam zipụrụ Adoniram, onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye, ma ndị Izrel niile ji nkume tugbuo ya. Ma eze Rehoboam jisiri ike gbaba nʼime ụgbọ agha ya, gbalaga laa Jerusalem. Ya mere, Izrel nọ na nnupu isi megide ụlọ Devid ruo taa. Mgbe ndị Izrel nụrụ na Jeroboam alaghachitala, ha ziri ya ozi sị ya pụta nʼihu ọha mmadụ. Nʼebe ahụ ka ha nọ mee ya eze Izrel. Ọ dịghị ebo ọbụla kwenyere iso ụlọ Devid, karịakwa ebo Juda.

I. NDI-EZE 12:1-20 Bible Nso (IGBOB)

Rehoboam we jerue Shekem: n'ihi na Shekem ka Israel nile biaruru, ime ya eze. O rue, mb͕e Jeroboam nwa Nebat nuru ya, (ma onye ahu nānọ n'Ijipt rue mb͕e ahu, ebe o siri n'iru Solomon, bú eze, b͕alaga, Jeroboam we biri n'Ijipt, ha we ziga, kpọ ya;) na Jeroboam na nkpọkọta Israel nile biara, we gwa Rehoboam okwu, si, Nna-gi mere yoke-ayi ka o sie ike: ma ub͕u a gi onwe-gi me ka ọ di nfe kari, bú òfùfè siri ike nke nna-gi, na yoke-ya di arọ́ nke ọ tukwasiri ayi, ayi gēfè kwa gi òfùfè. Ọ si ha, Lanu rue ubọchi atọ ọzọ, laghachikutekwam. Ndi Israel we la. Eze, bú Rehoboam, we me ka ndi-okenye dua ya ọdu, bú ndi nēguzo n'iru Solomon, bú nna-ya, mb͕e ọ nọ na ndu, si, Ùnu onwe-unu si aṅa nādu ọdu iweghachiri ndi nka okwu? Ha we gwa ya okwu, si, Ọ buru na i ghọrọ ndi nka orù ta, we fè ha òfùfè, za ha, gwa ha okwu di nma, ha gāghọ-kwa-ra gi orù ubọchi nile. Ma ọ rapuru idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya, o me ka umu-okorọbia dua ya ọdu, bú ndi ya na ha tokọzuru okè, ndi nēguzo n'iru ya. Ọ si ha, Gini ka unu onwe-unu nādu ọdu, ka ayi we weghachiri ndi nka okwu, bú ndi gwaworom okwu, si, Me ka ọ di nfe kari, bú yoke nke nna-gi tukwasiri ayi? Umu-okorọbia ndi ya na ha tokọzuru okè we gwa ya okwu, si, Otú a ka i gāsi ndi nka, ndi gwara gi okwu, si, Nna-gi mere yoke-ayi ka ọ di arọ́, ma gi onwe-gi me ka ọ di ayi nfe kari; otú a ka i gāgwa ha, si, Nkpisi-aka nke-ntà nkem di okpotokpo kari úkwù nnam. Ma ub͕u a nnam boro unu yoke di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti. Jeroboam na ndi Israel nile we biakute Rehoboam n'ubọchi nke-atọ, dika eze kwuru, si, Laghachikutem n'ubọchi nke-atọ. Eze we za ndi ahu okwu ike, rapu idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya; o we gwa ha okwu dika idu-ọdu nke umu-okorọbia si di, si, Nnam mere yoke-unu ka ọ di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti. Eze we ghara ige ndi Israel nti; n'ihi na nchighari nka sitere n'aka Jehova, ka O we me ka okwu-Ya guzosie ike, bú nke Jehova gwara Jeroboam nwa Nebat site n'aka Ahaija onye Shailo. Israel nile we hu na eze egeghi ha nti, ndi Israel we weghachiri eze okwu, si, Òkè gini ka ayi nwere nime Devid? ọ dighi kwa ihe-nketa di nime nwa Jese: lanu n'ulo-ikwū-unu, Israel: ub͕u a le ulo-gi, Devid. Israel we la n'ulo-ikwū-ha. Ma umu Israel ndi bi n'obodo nile nke Juda, Rehoboam we buru eze-ha. Eze, bú Rehoboam, we ziga Adoram, onye bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè; Israel nile we were nkume tub͕ue ya, o we nwua. Eze, bú Rehoboam, we b͕a onwe-ya ume irigo n'ub͕ọ-ala-ya, ib͕alaga na Jerusalem. Israel we jehie megide ulo Devid, rue ta. O rue, mb͕e Israel nile nuru na Jeroboam alatawo, ha we zìe kpọ ya ibia na nzukọ-ha, ha we me ya eze Israel nile: ọ dighi ebo ọ bula soro ulo Devid, ma-ọbughi ebo Juda, nání ya.