I. NDI-EZE 10:1-13
I. NDI-EZE 10:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe eze nwanyị Sheba nụrụ akụkọ Solomọn, na ịdị na mma nke dị nʼetiti ya na ONYENWE ANYị, ọ bịara ka o were ọtụtụ ajụjụ siri ike nwalee Solomọn. Ọ bịarutere Jerusalem, ya na ọtụtụ ndị ozi nʼebe ha bara ụba, ndị so ya, tinyere ọtụtụ ịnyịnya kamel ndị bu ụda dị iche iche, ọtụtụ ọlaedo na nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche. Ọ bịakwutere Solomọn, ya na ya kparịtara ụka banyere ihe niile nke dị ya nʼobi. Solomọn zara ya ajụjụ ya niile; ọ dịkwaghị ihe siiri eze ike ịkọwara ya. Mgbe eze nwanyị Sheba hụrụ amamihe niile nke Solomọn, hụkwa ụlọeze o wuru, na ihe oriri a na-adọkwasị nʼelu tebul ya, usoro ọnọdụ nke ndịisi ọchịchị ya, na ndị guzo na-ejere ya ozi nʼuwe ha yi, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ ya, na aja nsure ọkụ niile ọ na-achụ nʼụlọnsọ ONYENWE ANYị, ọ dịkwaghị ihe ọzọ ọ maara ọ ga-eme, maọbụ kwuo. Ọ sịrị eze, “Akụkọ niile m nọ nʼala m nụ banyere ihe niile ị rụpụtara na amamihe gị bụ eziokwu. Ma ekwenyeghị m akụkọ ndị a tutu ruo mgbe m bịara jiri anya m abụọ hụ ha. Nʼezie, ihe m nụrụ erughị ọkara; nʼamamihe nakwa nʼịba ụba gị, ị tụkwasịla ihe nʼakụkọ m nụrụ. Lee, ụdị ọṅụ ndị gị na-enwe. Lee, ụdị ọṅụ nke ndị ozi na-enwe, bụ ndị na-eguzo nʼihu gị mgbe niile na-anụ okwu amamihe gị. Ngọzị dịrị ONYENWE ANYị Chineke gị, onye nwere mmasị nʼebe ị nọ, o debere gị nʼocheeze Izrel. Nʼihi ịhụnanya nke ONYENWE ANYị na-adị ruo mgbe ebighị ebi nʼebe Izrel nọ, o meele gị eze, ka ị debe ikpe ziri ezi na ezi omume.” O nyere Solomọn onyinye ọlaedo ịdị arọ ya dị puku kilogram anọ, nyekwa ya ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ dị iche iche, na ọtụtụ nkume dị oke ọnụahịa. O nwebeghị oge ọzọ ewebatara ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ dịka ndị ahụ eze nwanyị Sheba nyere eze Solomọn. (Ọzọkwa, ọtụtụ ụgbọ mmiri nke eze Hiram bubatara ọlaedo site nʼỌfịa bulatara Solomọn. Ha sitekwara nʼebe ahụ bute osisi almụg nʼebe ọ bara ụba, na ọtụtụ nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche. Eze ji osisi almụg ndị a wuo ogidi ndabere dị nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị na nke ụlọeze. O jikwa ya meere ndị na-abụ abụ ụbọ akwara na une. Ọ dịbeghị mgbe ọbụla ahụrụ maọbụ tụbata osisi almụg ha otu a site nʼụbọchị ahụ ruo taa.) Eze Solomọn nyekwara eze nwanyị Sheba ihe niile ọ chọrọ na ihe niile bụ nke ọ rịọrọ, na-agụnyeghị onyinye niile Solomọn nyere ya dịka eze ọ bụ. Emesịa, ọ hapụrụ laghachi nʼala nke aka ya, ya na ndị na-ejere ya ozi.
I. NDI-EZE 10:1-13 Bible Nso (IGBOB)
Eze-nwayi Sheba we nānu akukọ Solomon bayere aha Jehova, o we bia iwere ilu di iche iche nwa ya. Ọ biarue Jerusalem, ya na usu di ọtutu nke-uku, camel nēbu uda di iche iche, na ọla-edo bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: o we biakute Solomon, gwa ya okwu nile nke di ya n'obi. Solomon we gosi ya okwu-ya nile: ọ dighi okwu ọ bula ezonariri eze nke ọ nēgosighi ya. Eze-nwayi Sheba we hu amam-ihe nile nke Solomon, na ulo nke o wuru, na ihe-oriri nke table-ya, na nnọdu nke ndi-orù-ya, na nguzo nke ndi nējere ya ozi, na uwe-ha, na ndi-obu-ihe-ọṅuṅu-ya, na àjà-nsure-ọku-ya nke ọ nēsure n'ulo Jehova; mọ adighi kwa nime ya ọzọ. O we si eze, Ezi-okwu ka okwu ahu bu nke m'nuru n'alam bayere okwu-gi nile, baye-kwa-ra amam-ihe-gi. Ma ekweghm okwu ahu, rue mb͕e m'biara, anyam abua we hu ya: ma, le, egosighm nkera-ya: i tukwasiwo amam-ihe na idi-nma n'akukọ nke m'nuru. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndikom-i bu, ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi-orù-gi ndia bu, ndi nēguzo n'iru gi mb͕e nile, ndi nānu amam-ihe-gi. Ka Jehova, bú Chineke-gi, buru onye agọziri agọzi, Onye ihe-gi tọrọ Ya utọ, itiyekwasi gi n'oche-eze Israel: ọ bu n'ihi na Jehova huru Israel n'anya rue mb͕e ebighi-ebi ka O doro gi eze, ime ihe ekpere n'ikpe na ezi omume. O nye eze ọgu talent ọla-edo isi, na uda di iche iche bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: ọ dighi uda biara ọzọ nke di ka uda ahu n'iba-uba, bú nke eze-nwayi Sheba nyere eze, bú Solomon. Ọzọ kwa, ub͕ọ Hairam, nke siri n'Ofia bute ọla-edo, ha siri n'Ofia bubata osisi almug bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia. Eze we were osisi almug ahu mere ulo Jehova, me-kwa-ra ulo eze, ihe-ndabere, ọ were kwa ha mere ndi nābù abù ubọ-akwara na une: osisi almug di otú a abiaghi, ahughi kwa ha, rue ta. Eze, bú Solomon, nye-kwa-ra eze-nwayi Sheba ihe nile nātọ ya utọ, ihe ọ bula ọ riọrọ, nāgughi ihe o nyere ya dika aka eze, bú Solomon, si di. O we chigharia la n'ala-ya, ya onwe-ya na ndi-orù-ya.